Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 6:15 - Bible Nso

15 n'ihi na Chineke ekworo ka Jehova, bú Chineke-gi, bu n'etiti gi; ka iwe Jehova, bú Chineke-gi, we ghara idi ọku megide gi, O we kpochapu gi n'elu ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu, bụ Chineke ekworo. Ọ ga-eme ka iwe ya dị ọkụ megide unu, ọ ga-ekpochapụkwa unu site nʼelu ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 6:15
20 Iomraidhean Croise  

N'ihi na ọ fọduru ubọchi asa, Mu onwem gaje ime ka miri zosa n'uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali; M'gēkpochapu kwa n'elu ala ihe nile ọ bula di ndu nke M'meworo.


Ihe a we ghọrọ ulo Jeroboam nmehie, ọbuná izopu ya, na ikpochapu ya n'elu uwa.


ha we nēme ndi-ozi Chineke ka ha buru ihe-ọchì, ha nēlelì kwa okwu-Ya anya, nēme kwa onwe-ha ndi-aghughọ n'ebe ndi-amuma-Ya nọ, rue mb͕e ọnuma Jehova lara elu imegide ndi-Ya, rue mb͕e ngwọta nādighi.


Ònye mara ike nke iwe-Gi, Na nrubiga-ókè nke iwe-Gi dika egwu nke kwesiri Gi si di?


N'ihi na emewo ka ayi gwusia n'iwe-Gi, Ọ bu kwa n'ọnuma-Gi ka emeworo ka ayi ma jijiji.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a, Le, M'gaje isi n'elu uwa zilaga gi: n'arọ a ka gi onwe-gi gānwu, n'ihi na okwu nwezuga ka i kwuworo megide Jehova.


ọ buru na unu adighi-emeb͕u ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwanyi di-ya nwuru, ọ buru kwa na unu adighi-awusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a, ọ buru kwa na unu adighi-ejeso chi ọzọ di iche iche ime onwe-unu ihe ọjọ:


Nání unu ka M'maworo n'etiti ab͕uru nile nke uwa: n'ihi nka ka M'gēji ajọ omume nile unu leta unu.


Le, anya abua nke Onye-nwe-ayi Jehova di n'aru ala-eze a nke juputara na nmehie, M'gēkpochapu kwa ya n'elu uwa; nání na M'gaghi-ekpochapusi ulo Jekob; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Eme-kwa-la ka ala ahu, nke unu onwe-unu nēbi nime ya, rua árú, nke Mu onwem nēbi n'etiti ya: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova, nēbi n'etiti umu Israel.


Ma-ọbu àyi nākpasu Onye-nwe-ayi ekworo? àyi ka Ya ike?


iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


N'ihi na ọ gēwezuga nwa-gi nwoke n'isom n'azu, ka ha we fè chi ọzọ: iwe Jehova gādi kwa ọku megide unu, Ọ gēkpochapu kwa gi ngwa ngwa.


Ma ọ buru na unu alaghachi ma-ọli, we rapara n'aru ndi fọduru nke mba ndia, bú ndia fọduru n'etiti unu, unu na ha ewe lurita nwunye, unu ewe bakuru ha, ha ewe bakuru kwa unu:


Mb͕e unu gāgabiga ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, nke O nyere unu n'iwu, mb͕e unu gēje kwa fè chi ọzọ, kpọ isi ala nye ha; iwe Jehova gādi kwa ọku n'aru unu, unu gālapu kwa n'iyì ngwa ngwa n'ezi ala ahu nke O nyeworo unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan