Jehova we si Moses, Le, Mu onwem nābiakute gi n'igwe-oji b͕ara ọchichiri, ka ndim we nu mb͕e M'nākpa-yere gi uka, ọzọ kwa, ka ọ we buru gi onwe-gi ka ha gēkwere rue mb͕e ebighi-ebi. Moses we gosi Jehova okwu nile nke ndi Israel.
Jehova we gwa Moses okwu iru n'iru, dika madu nāgwa eyì-ya okwu. Ọ we laghachi n'ọmuma-ulo-ikwū ahu: ma onye nējere ya ozi, bú Joshua, nwa Nun, bú okorọbia, adighi-esi n'etiti Ulo-ikwū ahu pua.
ọnu na ọnu ka M'gāgwa ya okwu ọbuná n'ile-anya, ọ bughi kwa n'ilu di iche iche; udi Jehova ka ọ gēlegide kwa anya: ọ̀ bu kwa gini mere unu nātughi egwu ikwu okwu megide orùm, bú imegide Moses?
ha gāgwa kwa ndi bi n'ala nka okwu a: ha anuwo na Gi onwe-gi, Jehova, nọ n'etiti ndi nka; n'ihi na anya na anya ka ahuworo Gi onwe-gi, Jehova, igwe-oji-Gi nēguzo kwa n'elu ha, ọ bu kwa n'ogidi igwe-oji ka Gi onwe-gi nēje ije n'iru ha n'ehihie, na n'ogidi ọku n'abali.
N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu.
Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.