Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 5:32 - Bible Nso

32 Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Lezienụ anya ime ihe ndị ahụ niile Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyere unu nʼiwu. Unu esitela na ha wezuga onwe unu gaa nʼaka nri maọbụ nʼaka ekpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 5:32
26 Iomraidhean Croise  

ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ:


M'gaghi-eme kwa ka ukwu Israel si n'ala nke M'nyere ndi bu nna-ha waghari ọzọ; nání ọ buru na ha elezi anya ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo ha n'iwu, na dika iwu nile si di nke orùm, bú Moses, nyēre ha n'iwu.


O me ihe ziri ezi n'anya Jehova, je ije n'uzọ nile nke Devid nna-ya, o wezugaghi kwa onwe-ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.


Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha? Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.


Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, me ka ayi lata; Me ka iru-gi mua, ewe zọputa ayi.


N'ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, Na udo, ka ha gātukwasiri gi.


Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.


nti-gi abua gānu kwa okwu n'azu-gi, si, Nka bu uzọ, jenu ije nime ya; mb͕e unu nēche iru n'aka-nri, na mb͕e unu nēche iru n'aka-ekpe.


Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu; jegharianu n'ukpurum nile, debe-kwa-nu ikpém nile, me ha:


Orùm, bú Devid, gābu kwa eze-ha; ọ bu kwa otù onye-ọzùzù-aturu ka ha nile gēnwe: ọ bu kwa n'ikpém nile ka ha gējeghari, ukpurum nile ka ha gēdebe kwa, me ha.


Unu gēlezi kwa anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke mu onwem nētiye n'iru unu ta.


Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.


dika iwu ahu si di nke ha gēzí gi, na dika ikpé ahu si di nke ha gāgwa gi, otú a ka i gēme; ewezugala onwe-gi pua n'okwu ahu ha gēgosi gi, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe.


ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n'ihe enyere n'iwu wezuga onwe-ya, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n'ala-eze-ya, ya onwe-ya na umu-ya, n'etiti Israel.


Lezie onwe-gi anya n'ihe-otiti ekpenta, ilezi anya nke-ọma, na ime dika ihe nile si di nke ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, gēzí unu: dika m'nyere ha iwu, otú a ka unu gēlezi anya ime.


ma ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe n'okwu nile ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu ta, ijeso chi di iche iche ọzọ ifè ha òfùfè.


ayi we were ala-ha, were ya nye ndi Reuben, nye kwa ndi Gad, nye kwa nkera ebo Manase, n'ihe-nketa.


Unu gējisi ike idebe ihe ahu nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, unu gēdebe kwa ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke O nyeworo gi n'iwu.


Ezi omume ka ọ gābu-kwa-ra ayi, mb͕e ayi gēlezi anya ime ihe a nile enyere n'iwu n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, dika O nyere ayi iwu.


I gānu kwa, Israel, lezi kwa anya ime ya; ka o we diri gi nma, ka unu we ba kwa uba nke-uku, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu, n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.


Ihe nile enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, unu gēlezi anya ime ya, ka unu we di ndu, ba uba, we ba nime, nweta kwa ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha.


Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.


Di-kwa-nu ike nke-uku idebe na ime ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu Moses, ka unu ghara isi nime ya wezuga onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe;


N'ihi na ọ gākawori nma ma ọ buru na ha akāmazughi uzọ ezi omume, kari imazu ya, we si n'ihe di nsọ ahu enyere n'iwu, nke enyere ha n'aka idebe, laghachi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan