Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 5:16 - Bible Nso

16 Sọpuru nna-gi na nne-gi, dika Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu: ka ubọchi-gi we di anya, ka ọ we di-kwa-ra gi nma, n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Sọpụrụ nne gị na nna gị, dịka Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼiwu, ka ụbọchị ndụ gị dị ogologo, ka ihe dịkwara gị mma nʼala ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 5:16
17 Iomraidhean Croise  

Sọpuru nna-gi na nne-gi: ka ubọchi-gi we di anya n'elu ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Nwam, echezọla iwum; Ma ka obi-gi chebe ihe nile m'nyere n'iwu:


Nna na nne ka ha lelìworo nime gi; ọbìa ka ha jiworo nmeb͕u emeso n'etiti gi: nwa-nb͕ei na nwanyi di-ya nwuru ka ha meworo ihe-ike nime gi.


Unu gātu egwu, onye ọ bula ọ tua egwu nne-ya na nna-ya, unu gēdebe kwa ubọchi-izu-ikem nile: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Sọpuru nna-gi na nne-gi: na, Hu onye-ab͕ata-obi-gi n'anya dika onwe-gi.


I matawo ihe nile enyere n'iwu, Eb͕ula madu, Akwala iko, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Emeb͕ula madu, Sọpuru nna-gi na nne-gi.


N'ihi na Moses siri, Sọpuru nna-gi na nne-gi; na, Onye kwujọrọ nna ma-ọbu nne, ya nwua ọnwu ahu:


I matawo ihe nile enyere n'iwu, Akwala iko, Eb͕ula madu, Ezula ori, Ab͕ala àmà ugha, Sọpuru nna-gi na nne-gi.


ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi inye ha, inye kwa nkpuru-ha, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù erù nime ya.


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēlelì nna-ya ma-ọbu nne-ya. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M'nyere n'iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi!


N'uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu n'iwu ka unu ganēje, ka unu we di ndu, ka o we di-kwa-ra unu nma, ka unu we me kwa ka ubọchi-unu di anya n'ala ahu nke unu gēnweta.


ka i we tua egwu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ukpuru-Ya nile na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu, gi onwe-gi, na nwa-gi, na nwa nwa-gi, ubọchi nile nke ndu-gi; ka ubọchi-gi we di kwa anya.


Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n'ihe nile, n'ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan