Diuteronomi 5:14 - Bible Nso14 ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na ehi-gi, na inyinya-ibu-gi, na anu-ulo-gi nile, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula; ka orù-gi nwoke na orù-gi nwayi we zuru ike dika gi onwe-gi nēzu. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a14 ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izuike nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ị gaghị arụ ọrụ ọbụla nʼụbọchị ahụ, gị onwe gị, nwa gị nwoke na nwa gị nwanyị, onye ọrụ gị nwoke, onye ọrụ gị nwanyị, ehi gị, ịnyịnya ibu gị maọbụ anụ ụlọ gị ọbụla, ọ bụladị onye ọbịa bi nʼobodo gị, ka ohu gị nwoke na ohu gị nwanyị zuru ike dịka gị onwe gị si ezu ike. Faic an caibideil |
Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri.
Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n'etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile.