Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 4:44 - Bible Nso

44 Nka bu kwa iwu ahu nke Moses doro n'iru umu Israel:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

44 Nke a bụ iwu Mosis chere nʼihu ụmụ Izrel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 4:44
14 Iomraidhean Croise  

ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ:


Ndia bu ihe enyere n'iwu, nke Jehova nyere Moses n'iwu bayere umu Israel n'ugwu Sainai.


Chetanu iwu Moses, bú orùm, nke M'nyere ya n'iwu na Horeb inye Israel nile, bú ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche.


Ndia bu ihe enyere n'iwu, na ikpé, nke Jehova nyere umu Israel n'iwu n'aka Moses n'ala ihe nādighi nke Moab n'akuku Jọdan na nso Jeriko.


N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.


n'ofè Jọdan, n'ala Moab, ka Moses jisiri ike ikpọputa isi iwu a, si,


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nēmeghi ka okwu nile nke iwu a guzosie ike, ime ha. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


i gēdekwasi kwa ha okwu nile nke iwu a, mb͕e i gabigasiri; ka i we ba n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, bú ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya, dika Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu.


I gēdekwasi kwa na nkume ndia okwu nile nke iwu a, agātu akika ha nke-ọma.


Iwu ka Moses nyere ayi, Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.


bú Biza nime ọzara, n'ala ahu di lari, ka ọ diri ndi Reuben; na Remot nime Gilead, ka ọ diri ndi Gad; na Golan nime Beshan, ka ọ diri ndi Manase.


ndia bu ihe-àmà, na ukpuru, na ikpé, nke Moses gwara umu Israel, mb͕e ha si n'Ijipt puta;


Ma ndia bu eze ala ahu, ndi umu Israel tib͕uru, nweta ala-ha n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon, na Araba nile n'akuku ọwuwa-anyanwu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan