Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 4:2 - Bible Nso

2 Unu atukwasila ihe n'okwu ahu nke mu onwem nēnye unu n'iwu, unu agubì-kwa la ihe nime ya, idebe ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye unu n'iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Unu atụkwasịla iwu ọzọ nʼelu iwu ndị a, ma ọ bụkwanụ site na ha wepụ iwu ọbụla. Kama, meenụ ihe iwu ndị a na-ekwu, nʼihi na ha si nʼaka Onyenwe anyị Chineke unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 4:2
21 Iomraidhean Croise  

Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke, Ghara ichezọ omume nile nke Chineke, Ma debe ihe nile O nyere n'iwu:


Atukwasila ihe n'okwu-Ya nile, Ka O we ghara ibara gi nba, i we ghọ onye-okwu-ugha.


Ka ayi nuru nkwubì okwu a nile: tua egwu Chineke, debe kwa ihe nile Ọ nyere n'iwu; n'ihi na nka bu ọlu madu nile.


Otú a ka Jehova siri: Guzo n'ogige ulo Jehova, gwa obodo nile nke Juda, bú ndi nābia ikpọ isi ala n'ulo Jehova, okwu nile nke M'nyere gi n'iwu igwa ha; agubìla otù nime ha.


N'ihi na n'ezie asim unu, Rue mb͕e elu-igwe na ala gāgabiga, ọ dighi otù ihe ọ bula dikarisiri ntà gāgabiga n'iwu ma-ọli, rue mb͕e ihe nile gēme.


Unu nuru na ekwuru, si, Hu madu-ibe-gi n'anya, kpọ kwa onye-iro-gi asì:


Umu-nnam, anamekwu dika madu: Asi na ọ bu nání ọb͕ub͕a-ndu madu, mb͕e edozisiri ya nke-ọma, ọ dighi onye ọ bula nēwezuga ya, ma-ọbu nētiye ihe ọzọ nime ya.


O rue, n'arọ nke-ọgu-abua, n'onwa nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na Moses gwara umu Israel okwu, dika ihe nile Jehova nyere ya n'iwu inye ha si di;


Ihe ọ bula nke mu onwem nēnye unu n'iwu, nke ahu ka unu gēlezi anya ime: atukwasila ihe n'elu ya, agubì-kwa-la ihe nime ya.


Mb͕e onye-amuma ma-ọbu ọrọ-nrọ gēbili n'etiti gi, nye gi ihe-iriba-ama ma-ọbu ihe-ebube,


Iwu ka Moses nyere ayi, Bú ihe-nnweta nke nkpọkọta Jekob.


Ọ bu kwa mu ka Jehova nyere iwu na mb͕e ahu izí unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu nāgabiga inweta ya.


I gēdebe kwa ukpuru-Ya nile, na ihe nile O nyere n'iwu, nke Mu onwem nēnye gi n'iwu ta, ka o we diri gi nma, di-kwa-ra umu-gi gānọchi gi, ka i we me kwa ka ubọchi-gi di anya n'elu ala ahu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ubọchi nile.


Le, ezíwom unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche íche, dika Jehova, bú Chinekem, nyerem iwu, ka unu we me otú a n'etiti ala ahu ebe unu onwe-unu nābà inweta ya.


Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na nkpuru-obi-ha di ha otú a, itu egwum, na idebe ihe nile M'nyere n'iwu ubọchi nile, ka ọ we diri ha nma, di-kwa-ra umu-ha, rue mb͕e ebighi-ebi!


Unu gēlezi kwa anya ime dika Jehova, bú Chineke-unu, nyeworo unu iwu: unu ewezugala onwe-unu n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe.


Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.


Ọ dighi okwu ọ bula n'ihe nile nke Moses nyere n'iwu nke Joshua nāgughi n'iru nkpọkọta nile nke Israel, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-ọbìa ndi nēje ije n'etiti ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan