Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 4:15 - Bible Nso

15 Lezi-kwa-nu nkpuru-obi-unu anya nke-uku; n'ihi na unu ahughi udi ọ bula n'ubọchi Jehova si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu na Horeb:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Unu maara na unu ahụghị ụdịdị Onyenwe anyị anya nʼụbọchị ahụ o sitere nʼọkụ gwa unu okwu nʼugwu Horeb. Ya mere kpachapụrụnụ onwe unu anya

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 4:15
22 Iomraidhean Croise  

ma mb͕e ala-ọma-jijiji gasiri ọku we di; ma Jehova anọghi n'ọku ahu: ma mb͕e ọku gasiri olu ntà nke di ezi nwayọ dara.


Gini ka okorọbia gēji me ka uzọ-ya di ọcha? Ọ bu n'ilezi ya anya dika okwu-Gi si di.


N'ọnwa nke-atọ mb͕e umu Israel putasiri n'ala Ijipt, n'ubọchi ahu ka ha batara n'ọzara Sainai.


Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, ma-ọbu oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:


Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; N'ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di.


Ewezugala onwe-gi n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe: Si n'ihe ọjọ wezuga ukwu-gi.


Ònye kwa ka unu gāsi na Chineke yiri ya? ma-ọbu ìhe-oyiyi gini ka unu gēdo n'usoro n'ebe Ọ nọ?


otú a ka Jehova siri: Lezienu onwe-unu anya, unu ebu-kwa-la ibu n'ubọchi-izu-ike, unu ebubà-kwa-la ya n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem;


Ọ̀ bughi kwa nání otù ka O mere, ọ bu ezie na O nwere mọ fọduru? Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka O mere nání otù? Ọ nāchọ nkpuru nke Chineke. N'ihi nka lezienu anya nime mọ-unu, ka nwoke ghara kwa ighọḅu nwunye ọ lutara n'okorọbia.


O we dekwasi na mbadamba nkume ahu, dika odide mbu ahu si di, okwu iri ahu, nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu: Jehova we nyem ha.


Jehova we si n'etiti ọku ahu gwa unu okwu: ọ bu olu okwu ka unu onwe-unu nānu, ma ọdighi onye unu nāhu anya; nání olu.


Ọ bu kwa mu ka Jehova nyere iwu na mb͕e ahu izí unu ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu nāgabiga inweta ya.


Lezienu onwe-unu anya, ka unu ghara ichezọ ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-unu, nke unu na Ya b͕ara, unu we mere onwe-unu arusi apiri api, bú udi ihe ọ bula nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi iwu bayere ya, si, Emela.


N'elu-igwe ka O si me ka i nu olu-Ya, ka O we dọ gi aka na nti: n'elu uwa ka O me-kwa-ra gi ka i hu ọku uku Ya; i we nu okwu-Ya nile site n'etiti ọku ahu.


Nání lezie onwe-gi anya, debe kwa nkpuru-obi-gi nke-ọma, ka i ghara ichezọ ihe nile nke anya-gi abua huworo, ka ha ghara kwa isi n'obi-gi wezuga onwe-ha ubọchi nile nke ndu-gi; kama gi me ka umu-gi na umu umu-gi mara ha;


Iru na iru ka Jehova kpayere unu uka n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu,


Gi emerela onwe-gi arusi apiri api, bú oyiyi nke udi ọ bula nke di n'elu-igwe n'elu, ma-ọbu nke di n'uwa n'okpuru ya, ma-ọbu nke di na miri n'okpuru uwa:


Jehova we nyem mbadamba nkume abua ahu nke ewere nkpisi-aka Chineke de; edekwasi-kwa-ra n'elu ha dika okwu nile si di nke Jehova gwara unu n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu n'ubọchi nkpọkọta ahu.


Onye, ebe Ọ bu nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya, ebe O nēbu kwa ihe nile site n'okwu nke ike-Ya, mb͕e Ọ sachasiri nmehie nile ayi, O we nọdu n'aka-nri nke Idi-uku ahu di n'elu;


Lezi-kwa-nu onwe-unu anya nke-ọma, ihu Jehova, bú Chineke-unu, n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan