Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 34:9 - Bible Nso

9 Joshua nwa Nun we juputa na mọ nke amam-ihe; n'ihi na Moses ebikwasiwo ya aka-ya abua: umu Israel we ge ya nti, me kwa dika Jehova nyere Moses iwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Joshua nwa Nun, jupụtara na mmụọ amamihe, nʼihi na Mosis ebikwasịla ya aka nʼisi. Ya mere, ụmụ Izrel ṅara Joshua ntị, gbasookwa iwu niile Onyenwe anyị nyere ha site nʼọnụ Mosis.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 34:9
20 Iomraidhean Croise  

le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.


Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?


Umu ndi-amuma ndi nọ na Jeriko na ncherita-iru ya we hu ya, si, Mọ Elaija anọkwasiwo Elaisha. Ha we bia izute ya, ha we kpọrọ ya isi ala.


O rue, mb͕e ha gabigasiri, na Elaija siri Elaisha, Riọ ihe m'gēmere gi, tutu ewepum n'ebe i nọ. Elaisha we si, Biko, ka òkè abua nke mọ-gi dikwasim.


Solomon we nọkwasi n'oche-eze Jehova, buru eze n'ọnọdu Devid, bú nna-ya, ihe we nāgara ya nke-ọma; Israel nile we nēge ya nti.


Umu Israel we je me ya; dika Jehova nyere Moses na Eron iwu, otú a ka ha mere.


Gi onwe-gi gāgwa kwa ndi nile nwere obi amam-ihe, bú ndi M'mejuworo na mọ amam-ihe, ka ha me uwe Eron ido ya nsọ, ka o we burum onye-nchu-aja.


emejuwokwam ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula,


Mọ nke Jehova gēnwe kwa ọnọdu-Ya n'aru ya, bú Mọ nke amam-ihe na nghọta, Mọ nke ndum-ọdu na idi-ike, Mọ nke ihe-ọmuma na egwu Jehova;


Mb͕e ahu Daniel nka ghọrọ ọkaka n'elu ndi-isi ahu na ndi ahu ndi nọchiri anya eze, n'ihi na mọ nke kachasi di nime ya; eze we zube ido ya onye-isi ala-eze-ya nile.


M'gāridata, kpayere gi uka n'ebe ahu M'gānara kwa ufọdu nime Mọ ahu nke dikwasi gi, tukwasi ha; ha gēso kwa gi bū ibu ndi Israel, ka i we ghara ibū ya, nání gi onwe-gi.


N'ihi na Onye ahu Chineke zitere nēkwu okwu Chineke: n'ihi na O siteghi n'ọtùtù enye Mọ Nsọ.


ndi ha guzoro n'iru ndi-ozi: mb͕e ha kpesiri ekpere, ha we bikwasi ha aka n'isi.


Umu Israel we kwara Moses ákwá n'ala ihe nādighi nke Moab orú ubọchi na iri: ubọchi nile nke ikwa-ákwá, bú oruru-újú Moses, we zue.


Onye àkù nile nke amam-ihe na ihe-ọmuma di nime Ya, bú ihe zoro ezo nime Ya.


Elefula onyinye-amara ahu nke di nime gi anya, nke esitere n'ibu-amuma, ya na ibikwasi-aka-n'isi nke ndi bu okenye, nye gi.


Ebikwasila onye ọ bula aka n'isi ọsọsọ, eso-kwa-la ndi ọzọ nwekọ nmehie-ha: debe onwe-gi ọcha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan