Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 33:2 - Bible Nso

2 Ọ we si, Jehova siri na Sainai bia, Si kwa na Sia walitere ha; O siri n'ugwu Peran nwuputa, O si-kwa-ra na ndi nsọ anāpughi iguta ọnu bia: Ọku di n'aka-nri-Ya, bú iwu enyere ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ọ sịrị, “Onyenwe anyị si nʼugwu Saịnaị bịa, ọ waliteere ha site nʼugwu Sia, o nwupụtara site nʼugwu Paran Ya na igwe ndị nsọ so bịa site nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 33:2
24 Iomraidhean Croise  

Ha we si na Midian bilie, biarue Peran: ha we si na Peran chiri ndikom tiyere onwe-ha, bata n'Ijipt, biakute Fero, bú eze Ijipt; o we nye ya ulo, si ka enye ya nri, o nye-kwa-ra ya ala.


Site na Zaion, bú ebe mazuru nma, Ka Chineke nwuputaworo ka ìhè.


Ub͕ọ-ala Chineke di orú nnú uzọ abua na nnù iri, ha di nnù abua na ọgu iri uzọ nādighi iguta ọnu: Onye-nwe-ayi nọ n'etiti ha, Sainai di nime ebe nsọ Ya.


I rigoruwo n'ebe di elu; dọta usu ndi adọtara n'agha n'agha; I natawo onyinye di iche iche n'etiti madu, E, ọbuná n'etiti ndi nēwezuga onwe-ha, ka Ja, bú Chineke, we biri n'etiti ha.


Le, Mu onwem nēziga mọ-ozi n'iru gi, idebe gi n'uzọ, na ime ka i bata n'ebe ahu M'doziworo.


Anọm nāhu n'ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam, ma, le, otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, nēsi n'elu-igwe rida.


Chineke si na Timan nābia, Onye Nsọ si kwa n'ugwu Peran. Selah Ebube-Ya ekpuchiwo elu-igwe nile, Otuto-Ya juputa-kwa-ra uwa.


Umu Israel we si n'ọzara Sainai bulie ije dika nbuli-ije nile ha si di; igwe-oji ahu we nọdu n'ọzara Peran.


unu ndi natara iwu ahu dika enyere ya site n'aka ndi-mọ-ozi, ma unu edebeghi ya.


Ma ọ buru na ije-ozi nke ọnwu, nke edeworo n'akwukwọ, nke atuworo n'elu nkume, biara n'ebube, nke mere umu Israel apughi ilegide iru Moses anya n'ihi ebube nke iru-ya; ebube nke anēme ka ọ ghara idi irè:


N'ihi na asi na ije-ozi nke ọmuma-ikpé bu ebube, ije-ozi nke ezi omume gēnwebiga ebube ókè kari nke-uku.


N'ihi na ka ha ra, bú ndi sitere n'ọlu nke iwu, ha nọ n'okpuru ọbubu-ọnu: n'ihi na edewo ya n'akwukwọ nsọ, si, Onye anābu ọnu ka ọ bu, bu onye ọ bula nke nānọgideghi n'ihe nile edeworo n'akwukwọ iwu, ime ha.


Gini kwa bu iwu ahu? Atukwasiri ya n'ihi njehie, rue mb͕e Nkpuru ahu gābia, bú Onye ekweworo nkwa; esitekwara n'aka ndi-mọ-ozi nye iwu ahu site n'aka onye-ob͕ub͕o.


Ma ewere ihe ndia ma atù: n'ihi na ndinyom abua ndia bu ọb͕ub͕a-ndu abua; otù si n'ugwu Sainai puta, nāmu umu nye n'orù, nwanyi ahu bu Hega.


Okwu ndia ka Jehova were oké olu gwa nkpọkọta-unu nile n'ugwu ahu site n'etiti ọku ahu, na igwe-oji ahu, na oké ọchichiri ahu: ma Ọ tukwasighi ihe ọzọ. O we dekwasi ha na mbadamba nkume abua, were ha nyem.


na inyeghachi unu, bú ndi anākpab͕u, aru-efè, ayi na unu, nime nkpughe nke Onye-nwe-ayi Jisus site n'elu-igwe, Ya na ndi-mọ-ozi nke ike-Ya,


n'ihi na ha anānagideghi ihe enyere n'iwu, bú, Asi na ọbuná anu-ulo emetu ugwu ahu, agēwere nkume tub͕ue ya;


N'ihi na asi na emere okwu ekwuru site n'ọnu ndi-mọ-ozi ka o guzosie ike, asi kwa na njehie nile ọ bula na aṅaghi-nti nile ọ bula natara nnyeghachi nke ugwọ-ọlu ziri ezi;


Ọ bu kwa ndia ka Inok, bú onye-asa site n'Adam, buru amuma, si, Le, Onye-nwe-ayi biara Ya na ndi nsọ Ya, anāpughi iguta ọnu,


M'we hu, nu kwa olu ọtutu ndi-mọ-ozi ndi nọ oche-eze ahu na ihe anọ ahu nke di ndu na ndi-okenye ahu gburugburu; ọnu-ọgugu-ha riri oké nne nke-uku, nke anāpughi iguta ha;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan