Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 33:17 - Bible Nso

17 Nwa ehi-ya buru uzọ mu, ima-nma diri ya; Mpi nke atu ka mpi-ya abua bu kwa: Ọ gēwere ha sọkọta ndi nile, rue nsọtu nile nke uwa: Ndi ahu bu kwa usu nile nke orú nnù ndikom na nnù ise nke Efraim, Ndi ahu bu kwa usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri nke Manase.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ, mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa. Ya ka ọ ga-eji sọda mba niile ọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa. Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dị otu a ka imerime puku ndị Manase dị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 33:17
27 Iomraidhean Croise  

Nna-ya we ju, si, Amawom, nwam, amawom: ya onwe-ya gāghọ kwa otù ndi, ya onwe-ya gādi kwa uku: ma otú ọ di, nwa-nne-ya nke-ntà gādi uku kari ya, nkpuru-ya gāghọ kwa ùjú nke mba nile.


Zedekaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.


Site kwa na nkera ebo Manase, orú nnù uzọ abua na nnù ise, ndi akpọrọ n'aha n'aha, ibia ime Devid eze.


Site kwa n'umu Isaka, bú ndi mara nghọta bayere mb͕e ahu nile, imara ihe Israel gēme; ndi-isi-ha bu ọgu iri; umu-nne-ha nile nēme kwa dika okwu-ọnu-ha si di.


Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n'ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n'ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n'akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di.


N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:)


Umu nkera ebo Manase biri kwa n'ala ahu: site na Beshan rue Beal-heamon na Senia na ugwu Heamon ka ndi ahu bara uba.


Zedakaia nwa Keneana we mere onwe-ya mpi ígwè, si, Otú a ka Jehova siri, Ndia ka i gēji sọ Siria, rue mb͕e agēme ka ha gwusia.


Zọputam n'ọnu ọdum; Ọzọ, site na mpi atu ka I zaworom.


Ọ nēme ka ha nāwuli elu dika nwa-ehi; Bú Lebanon na Siron, dika nwa-atu.


Site na Gi ka ayi ga-akwatu ndi nākpab͕u ayi: Site n'aha-Gi ka ayi gāzọkwasi ndi nēbili imegide ayi ukwu.


Mu nwe Gilead, ọ bu kwa mu nwe Manase; Efraim bu kwa ebe siri ike nke isim; Juda bu nkpa-n'aka-ezem.


Ma I mewo ka mpim di elu dika mpi atu: Ejiwo manu ọhu wusam.


Atu gēso kwa ha rida, umu-oke-ehi kwa, ha na oke-ehi; ala-ha gāṅuju kwa ọbara afọ, agēme kwa ka ájá-ha ma abuba site n'abuba.


N'ihi na unu ji akuku na ubu-aka enuzuga, na n'ihi na unu ji mpi-unu asọzuga anu nile nāria ọria, rue mb͕e unu chusasiri ha n'èzi;


Ahurum ebulu ahu ka ọ nāsọ mpi n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida; ma ọ dighi anu ọ bula nēguzo n'iru ya, ọ dighi kwa onye nānaputa ihe n'aka-ya; ma ọ neme dika ọ tọrọ ya utọ, me onwe-ya uku.


Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.


Gini ka M'gēme gi, Efraim? gini ka M'gēme gi, Juda? n'ihi na ebere-unu di ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu.


Mb͕e M'gāgwọ Israel, mb͕e ahu ka ekpughere ajọ omume Efraim, na ihe ọjọ nile nke Sameria; n'ihi na ha aluwo ọlu ugha: ọzọ, onye-ori nābà n'ulo, usu ndi nāpunara madu ihe amadewo kwa n'èzí.


Chineke nēme ka ha si n'ala Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere


Chineke nēme ka o si n'Ijipt puta; Ume dika ume atu ka ọ nwere: O gēripia mba di iche iche, bú ndi nākpab͕u ya, Ọ bu kwa ọkpukpu nile ha ka ọ gēkpecha, Were kwa àkú-ya nile b͕arua ha aru.


Ndia bu ab͕uru Manase: ndi-ha agukọtara agukọta we di orú nnù uzọ isi, na nnù iri-na-otù, na ọgu iri-na-ise.


Ndia bu ab͕uru umu-ndikom Efraim, dika ndi-ha agukọtara agukọta si di, orú nnù uzọ anọ, na nnù, na ọgu ise. Ndia bu umu-ndikom Josef, dika ab͕uru nile ha si di.


Umu Josef we gwa Joshua okwu, si, Gini mere i nyeworom otù ihe-ife-nzà na otù òkè n'ihe-nketa; ma mu onwem bu ndi bara uba, n'ihi na Jehova agọziwom rue ub͕u a?


n'ihi na ugwu ahu ka i gēnwe; n'ihi na oké ọhia ka ọ bu, i gēb͕utu kwa ya, i gēnwe kwa ọpupu-ya nile: n'ihi na i gānapu ndi Kenean ala-ha, ọ bu ezie na ha nwere ub͕ọ-ala ígwè, ọ bu kwa ezie na ndi di ike ka ha bu.


Hana we kpe ekpere, si: Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova, Mpim adiwo elu n'ime Jehova: Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom, N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan