Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 33:14 - Bible Nso

14 Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-ọmume anyanwu, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ihe-npuputa nke ọnwa nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 33:14
15 Iomraidhean Croise  

Ọ di kwa ka ìhè ututu, mb͕e anyanwu nāwa, Bú ututu igwe-oji nādighi; Mb͕e ahihia ndu nēpuputa n'ala, Site n'ọmumu-anyanwu, site na miri-ozuzo.


O mere ọnwa ka ọ buru ihe igu mb͕e di iche iche akara àkà: Anyanwu mara ọdida-ya.


Gi nwe ehihie, ọzọ kwa, Gi nwe abali: Gi onwe-gi edoziwo ihe nēnye ìhè na anyanwu.


Mb͕e m'huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi, Ọnwa na kpakpando nile, nke I doziworo;


N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu: Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye: Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ.


M'gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha.


Ma unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi emume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù; unu gāpu kwa, wulie elu dika umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba.


ka unu we buru umu nke Nna-unu Nke bi n'elu-igwe: n'ihi na Ọ nēme ka anyanwu-Ya nāwakwasi ajọ madu na ezi madu, Ọ nēme kwa ka miri zokwasi ndi ezi omume na ndi ajọ omume.


Otú ọ di, Ọ rapughi Onwe-ya nēnweghi ihe-àmà, ebe Ọ nēme ezi ihe, nēnye kwa unu miri-ozuzo na oge nkpuru site n'elu-igwe, nēmeju obi-unu n'ihe-ọzùzù na ọṅù.


Jehova gēnye ngọzi-Ya iwu n'ebe i nọ n'ọba-gi nile, na nime nseti aka-gi nile; Ọ gāgọzi kwa gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi.


Ọ we kwue ihe bayere Josef, si, Ihe Jehova nāgọzi ka ala-ya bu; Site n'ihe di oké ọnu-ahia nke elu-igwe, site n'igirigi, Site kwa n'ob͕u-miri nke nāmakpu n'okpuru.


Site kwa n'isi ihe nke ugwu nke di site na mb͕e ochie, Site kwa n'ihe di oké ọnu-ahia nke ugwu ntà di mb͕e ebighi-ebi.


Nēnye ndi bu ọgaranya n'oge di ub͕u a iwu, ka ha ghara itukwasi uche-ha n'ihe di elu, ghara kwa itukwasi obi n'ihe ahu anējighi aka, bú àkù, kama ka ha tukwasi obi na Chineke, Onye nēwere àkù-Ya nye ayi ihe nile ka ha buru ihe gātọ ayi utọ;


n'etiti amá-ya. N'akuku a na n'akuku nke-ọzọ nke osimiri ahu ka osisi nke ndu di kwa, nāmi uzọ nkpuru iri na abua, nēnye nkpuru-ya n'ọnwa n'ọnwa: akwukwọ osisi ahu bu ihe ime ka aru di mba nile ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan