Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 33:11 - Bible Nso

11 Jehova, gọzie àkù-ya, Ka ọlu aka-ya abua tọ kwa Gi utọ: Mapue úkwù ndi nēbili imegide ya, Na nke ndi nākpọ ya asì, ka ha ghara ibili ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị, ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ. Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya, tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 33:11
18 Iomraidhean Croise  

ihe a nile onye-nwem eze ka Arọna, nyere eze. Arọna we si eze, Ka ihe-gi tọ Jehova, bú Chineke-gi, utọ


Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma, Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba; Selah


bú ndi nēme ka madu mehie site n'okwu-ha, ndi nēsi-kwa-ra onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama ọnyà, we were ihe tọb͕ọrọ n'efu wezuga onye ezi omume.


Ahuhu dirim, nnem, na i muwom onye-ọ̀gù na onye-esem-okwu n'ebe uwa nile di! ebinyeghm ego n'uma; madu ebinyeghkwam ego n'uma; ma onye ọ bula nime ha nākọcham.


Ka ihere me ndi nēsob͕um, ma ka ihere ghara ime mu onwem; ka ndi ahu tua ujọ, ma ka mu onwem ghara itu ujọ: me ka ubọchi ihe ọjọ biakwasi ha, were kwa okpukpu ntipia abua tipia ha.


Mb͕e ha debezusiri ubọchi asa ahu, ọ gēru kwa, n'ubọchi nke-asatọ, we ga n'iru, na ndi-nchu-àjà ganēme àjà-nsure-ọku nile unu na àjà-udo nile unu n'elu ebe-ichu-àjà; ihe-unu gātọkwam utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Ha nākpọ onye nāba nba n'ọnu-uzọ-ama asì, ọ bu kwa onye nēkwu okwu n'izu-okè ka ha nākpọ onye-árú.


Onye nānu okwu-unu nānu okwu Mu onwem; onye nāju kwa unu nāju Mu onwem; ma onye nāju Mu onwem nāju Onye ziterem.


Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile, Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel: Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi, Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.


O kwuru ihe bayere Benjamin, si, Onye Jehova huru n'anya gēbi na ntukwasi-obi n'akuku Ya; O nēkpuchi ya ogologo ubọchi nile, Ọ bu kwa n'etiti ubu-Ya abua ka o nēbi.


Ya mere onye nāju, ọ bughi madu ka ọ nāju, kama ọ bu Chineke, Onye nēnye Mọ Nsọ Ya ka Ọ ba nime unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan