Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 32:7 - Bible Nso

7 Cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, Ghọta arọ nke ọtutu ọb͕ọ: Jua nna-gi, ọ gēgosi kwa gi; Jua ndi-okenye-gi, ha gāgwa kwa gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Cheta ụbọchị ochie ndị ahụ gara aga, tulee ọgbọ ndị ahụ gara aga jụọ nna gị, ọ ga-akọrọ gị. Jụọ ndị okenye gị, ha ga-eme ka o doo gị anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 32:7
17 Iomraidhean Croise  

o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum: Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ.


Echetawom ikpé-Gi nile site na mb͕e ebighi-ebi, jehova, We kasie onwem obi.


Chineke, ayi ewerewo nti-ayi nu, nna-ayi-hà akọworo ayi, Ọlu I luru n'ubọchi-ha, n'ubọchi mb͕e ochie.


Gi onwe-gi jiri aka-gi napu mba ọzọ di iche iche ala-ha, we kua ha dika osisi nime ya; I nēmejọ ndi nile di iche iche, we me ka nna-ayi-hà wasa alaka.


Ọ̀ bu rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya gwuchapuworo? Ọ̀ gwusiwo, bú okwu-Ya, rue ọb͕ọ nile?


O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob, O do-kwa-ra iwu n'Israel, Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu, Ime ka umu-ha mara ha:


O gēru kwa, mb͕e umu-unu gāsi unu, Gini bu òfùfè a unu nwere?


O gēru kwa, mb͕e nwa-gi gāju gi n'ọdi-n'iru, si, Gini bu nka? na i gāsi ya, Ike nke aka ka Jehova jiri me ka ayi si n'Ijipt, n'ulo ndi-orù, puta:


Chetanu ihe mbu nile site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: n'ihi na Mu onwem bu Chineke, ọ dighi kwa Chineke ọzọ di; abum Chineke, ọ dighi kwa otù efu di ka Mu onwem;


Ndi-Ya we cheta ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga nke Moses, si, Òle ebe Onye ahu nọ nke mere ka ha si n'oké osimiri rigoputa n'aka onye nāzù ìgwè ewu na aturu-Ya? òle ebe Onye ahu nọ nke tiyere Mọ Nsọ Ya n'etiti ha?


N'ihi na biko, jua ajuju bayere ubọchi nile gara aga, nke buru gi uzọ, site n'ubọchi mb͕e Chineke kere madu n'elu uwa, site kwa n'otù nsọtu elu-igwe we rue nsọtu elu-igwe ọzọ, ma ihe dika ihe uku a adiwo, ma-ọbu na anuwo ihe di ka ya.


I gēcheta kwa uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-gi, mere gi ka i je ọgu arọ abua ndia n'ọzara, ka O we weda gi n'ala, inwa gi, ka O we mara ihe nke di n'obi-gi, ma i gēdebe ihe nile O nyere n'iwu, ma-ọbu na i gaghi-edebe.


Gideon we si ya, Biko, onye-nwem, ọ buru na Jehova nọyere ayi, n'ìhi gini kwa ka ihe a nile dakwasiworo ayi? òle ebe kwa ka ihe-ebube-Ya nile di, nke nna-ayi-hà kọrọ ayi akukọ ha, si, Jehova, Ọ̀ meghi ka ayi si n'Ijipt rigota? ma ub͕u a Jehova arapuwo ayi, nye kwa ayi n'aka Midian.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan