Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 32:42 - Bible Nso

42 M'gēme ka àkúm nile ṅubiga ọbara okè, Mma-agham gēri kwa anu-aru; Site n'ọbara ndi eb͕uru eb͕u na ndi adọtara n'agha, Site n'isi ndundu onye-iro.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

42 Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ, ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ, ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha, na isi ndị ndu ndị iro.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 32:42
16 Iomraidhean Croise  

Ọbara ndi eb͕uru eb͕u, abuba ndi-dike, Uta Jonatan esighi na ha la azu, Mma-agha Sọl esighi kwa lata n'efu.


N'ìhi gini ka I nēzo iru-Gi, Nēchè kwa na mu bu onye-iro n'ebe I nọ?


Àkú-gi nile bu ihe di nkọ; Ndi nile di iche iche nāda n'okpuru gi; Àkú-gi di n'obi ndi-iro eze.


Oche-eze-Gi, Chineke, nādiru mb͕e nile ebighi-ebi: Nkpa-n'aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n'aka-eze nke ala-eze-Gi bu.


Ka I we b͕aye ukwu-gi n'ọbara, Ka ire nkita-gi nile we si n'aru ndi-iro-gi kère òkè-ya.


N'ihi na mma-agham aṅujuwo afọ n'elu-igwe: le, Edom ka ọ gāridakwasi, ridakwasi kwa ndi M'wezugara ka ebibie ha, ikpe ikpe.


N'elu ebe nile di elu nke ọhia nādighi nke di n'ọzara ka ndi nāpunara madu ihe biaworo: n'ihi na mma-agha Jehova nwere nēripia site n'otù nsọtu nke ala we rue nsọtu ọzọ nke ala: ọ dighi udo anu-aru ọ bula, bú madu, nwere.


O gēru kwa, mb͕e i gēgosi ndi nka okwu ndia nile, ha ewe si gi, N'ìhi gini ka Jehova kwuworo ihe ọjọ uku a nile megide ayi? ma-ọbu gini bu ajọ omume-ayi? ma-ọbu gini bu nmehie-ayi nke ayi mehieworo megide Jehova, bú Chineke-ayi?


Ndi nile ndi nāhu gi n'anya echezọwo gi; ha adighi-achọ gi: n'ihi na otiti nke onye-iro, bú idọ-aka-na-nti nke onye nēnweghi obi-ebere, ka M'wereworo tie gi; n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi, n'ihi na nmehie-gi nile nwere ume.


Ma ubọchi ahu diri Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, ọ bu ubọchi ibọ̀-ọ́bọ̀, ka O we bọ̀rọ Onwe-ya ndi nēmegide Ya ọ́bọ̀: mma-agha gēripia kwa, afọ eju kwa ya, ọ gāṅuju kwa ọbara-ha afọ: n'ihi na àjà ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere n'ala Ugwu n'akuku osimiri Yufretis.


Gosinu n'Ijipt, menu ka anuru ya na Migdol, me-kwa-nu ka anuru nime Nof na nime Tahpanhes: sinu, Guzo onwe-gi, dozi-kwa-ra onwe-gi; n'ihi na mma-agha eripiawo buruburu gi.


Onye-nwe-ayi adiwo ka onye-iro, Ọ lodawo Israel; O lodawo ulo-elu-ya nile, O bibiwo ebe-Ya nile ewusiri ike: O me ka ize-ume na isu-ude ba uba n'ada Juda.


M'gēkpokwasi kwa ha ihe ọjọ; M'gāb͕apusi àkúm nile n'aru ha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan