N'ìhi gini ka ndi Ijipt ganēkwu, si, Ọ bu ime ha ihe ọjọ ka O mere ka ha pua, ib͕u ha n'ugwu, na ime ka ha si n'elu uwa gwusia? Si n'idi-ọku nke iwe-Gi chigharia, chegharia n'ihe ọjọ a I nēchè imegide ndi-Gi.
N'ihi na Gi onwe-gi bu Nna-ayi; n'ihi na Abraham amaghi ayi, Israel adighi-amata kwa ayi: Gi onwe-gi, Jehova, bu Nna-ayi; Onye-nb͕aputa-ayi site na mb͕e ebighi-ebi gara aga ka aha-Gi bu.
Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.
Jehova gēme kwa ka i b͕asa n'etiti ndi nile, site n'otù nsọtu uwa we rue nsọtu uwa nke-ọzọ; i gēfè kwa chi di iche iche ọzọ òfùfè n'ebe ahu, nke i nāmaghi, ma gi onwe-gi ma nna-gi-hà, bú osisi na nkume.