Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 32:25 - Bible Nso

25 Mma-agha gāb͕aba madu aka nwa n'èzí, Oké ujọ gāb͕aba kwa n'ime-ulo nile; Ọ gēkpochapu ma okorọbia ma nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Nwa nāṅu ara tinyere onye-isi-awọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha. Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi, ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 32:25
17 Iomraidhean Croise  

Ha we bilie n'ururuchi, ibà n'ọmuma-ulo-ikwū Siria: ha we biarue nsọtu ọmuma-ulo-ikwū Siria, ma, le, ọ dighi nwoke nọ n'ebe ahu.


O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.


Kama unu siri, É-è, n'ihi na inyinya ka ayi gānọkwasi b͕alaga; n'ihi nka unu gāb͕alaga: unu si-kwa-ra, Anu di ngwa ka ayi gānọkwasi; n'ihi nka ka ndi nāchu unu gādi ngwa.


Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n'ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n'etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;


n'iji ọlu nile nke aka-unu kpasuem iwe, n'isurere chi ọzọ di iche iche ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'ala Ijipt, ebe unu onwe-unu biaworo inọ dika ọbìa; ka ewe bipu unu, ka unu we ghọ kwa ihe-nkọcha na ihe-ita-uta n'etiti mba nile nke uwa?


N'ihi na ọnwu arigobatawo na window nile nke ayi, ọ batawo n'ulo-elu nile nke ayi; ibipu umu-ntakiri n'èzí, na umu-okorọbia n'amá nile.


Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku; Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku: N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.


Iré nke nwa nke nāṅu ara araparawo n'okpo-ọnu-ya site n'akpiri-ikpọ-nku: Umu-ntakiri nāriọ nri, ma ọ dighi onye nēkesara ha.


Mma-agha di n'èzí, ajọ ọria nke nēfe efe na oké unwu di kwa n'ulo: onye nọ n'ọhia gānwu na mma-agha; ọzọ, onye nọ n'obodo, oké unwu na ajọ ọria nēfe efe gērichapu ya.


Mma-agha gēfeghari kwa n'obodo-ya nile, me ka ihe-ntuchi-ya nile gwusia, ripia ha, site na ndum-ọdu nile ha.


E, ọ buru na ha azulite umu-ha, ma M'gāb͕aba ha aka nwa, madu ọ bula ewe ghara idi: e, ahuhu di-kwa-ra ha mb͕e M'gēsi n'aru ha wezuga Onwem!


Etib͕uwo Efraim, nkpọrọgwu-ha akpọnwuwo, ha agaghi-ami nkpuru: e, asi na ha amua nwa, ma M'gēme ka umu afọ-ha anāchọsi ike nwua.


M'gēme kwa ka mma-agha biakwasi unu, nke nābọ̀ ọ́bọ̀ ọb͕ub͕a-ndum; agāchikọta kwa unu nime obodo nile unu: M'gēzite kwa ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu; agēnye kwa unu n'aka ndi-iro.


Gi onwe-gi gēri ihe, ma afọ agaghi-eju gi; afọ-awọrọ-gi gādigide kwa nime gi: i gēwezuga kwa ndi-gi, ma i gaghi-eme ka ha b͕apu; ma ndi i nēme ka ha b͕apu, ọ bu mma-agha ka M'gēwere ha nye.


N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan