Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 32:24 - Bible Nso

24 Ha gābu ndi tara aru n'agu, na ndi nruru-ọku rub͕uworo, Ya na nbipu di ilu; Ezé anumanu ka M'gēzikwasi kwa ha, Ya na edide nke ihe nākpu akpu nke ájá.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha, na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu. Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha, na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 32:24
24 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke, we si agwọ ahu, N'ihi na i mewo nka, ihe anābu ọnu ka i bu kari anu-ulo nile, na kari anu ọhia nile ọ bula; afọ-gi ka i gēji je ije, ọ bu kwa ájá ka i ganēri ubọchi nile nke ndu-gi:


Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma, Hu kwa ala ahu, na ọ di uto; Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu, We ghọ onye nēfè òfùfè orù.


Nsi aju-ala ka ọ gāmiri: Ire agwọ gēb͕u ya.


Àkú di nkọ nke dike, Ha na icheku-ọku nke osisi broom.


Ma-ọbu site n'ajọ ọria nēfe efe nke nējeghari n'ọchichiri, Ma-ọbu site na nbipu nke nēbibi n'etiti-ehihie.


Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gātakọ nri n'otù, ọdum gāta kwa ahihia dika ehi: ma agwọ, ájá gābu nri-ya. Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile, ka Jehova siri.


Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe.


M'gēme kwa ka ab͕uru ihe anọ buru ndi-nlekọta-ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): mma-agha ib͕u eb͕u, na nkita idọb͕u adọb͕u, na anu-ufe nke elu-igwe, na anumanu nke uwa, iripia na ibibi.


Site n'ọnwu nke ọria di iche iche ka ha gānwu; agaghi-etiri ha aka n'obi, agaghi-elì kwa ha; ǹsí-anu n'elu ala ka ha gāghọ: ha gēsite kwa na mma-agha, site kwa n'oké unwu, gwusia; ozu-ha gāghọ-kwa-ra anu-ufe nke elu-igwe, ghọ-kwa-ra anumanu nke uwa, ihe-oriri.


N'ihi na, le, M'ganēzite agwọ, bú ubí, n'etiti unu, nke ọ nādighi urà agārà ha; ha gāta kwa unu aru; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Akpukpọ-aru-ayi di ọku dika ite-ọku uku Site n'ifufe di ọku nke oké ugwu.


Asi na emem ka ajọ anu-ọhia gabiga n'ala ahu, ha we b͕aba ya aka, o we ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye ọ bula nāgabiga ya n'ihi anu-ọhia ahu;


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Àgēsi kwa aṅa naputa ya ma-ọli mb͕e ọ bu ikpém anọ jọrọ njọ, bú mma-agha na oké unwu na ajọ anu-ọhia na ajọ ọria nēfe efe, ka M'zigara na Jerusalem, ibipu madu na anumanu nime ya?


M'gēzikwasi kwa unu oké unwu na ajọ anu-ọhia, ha gāb͕aba kwa unu aka nwa; ajọ ọria nēfe efe na ọbara gāgabiga kwa n'etiti gi; ọ bu kwa mma-agha ka M'gēme ka ọ biakwasi gi: Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo.


M'gēzite anu-ohia n'etiti unu, ha gēme kwa ka unu b͕a aka umu, ha gēb͕upu kwa anu-ulo-unu, me kwa ka unu di ole-na-ole, uzọ nile unu gātọb͕ọ kwa n'efu.


Ọ buru kwa na ha ezobe onwe-ha n'elu Kamel, n'ebe ahu ka M'gāchọputa ha were ha; ọ buru kwa na ezonari ha anyam abua n'ala oké osimiri, site n'ebe ahu ka M'gēnye agwọ ahu iwu, o we ta ha.


Ha gāracha ájá dika agwọ; dika ihe di iche iche nke nākpu akpu nke ala, otú a ka ha gēwere ima-jijiji si n'ebe-nmechibido nile ha puta: Jehova, bú Chineke-ayi, ka ha gābiakute n'oké egwu, ha gātu kwa egwu gi.


N'iru Ya ka ajọ ọria nke nēfe efe nāga, Anwuru-ọku si kwa n'ukwu-Ya abua nāputa.


Jehova gēwere ọtita-aru, were kwa aru-ọku, were kwa nruru-ọku, were kwa oké okpom-ọku, were kwa mma-agha, were kwa nchakpọ, were kwa ọmuma-ebù, tib͕ue gi; ha gāchu kwa gi rue mb͕e i gāla n'iyì.


i gēfè kwa ndi-iro-gi, ndi Jehova gēzì megide gi, n'agu, na n'akpiri-ikpọ-nku, na n'ib͕a-ọtọ, na n'ukọ ihe nile: ọ gētiye kwa yoke ígwè n'olu-gi, rue mb͕e ọ gēkpochapu gi.


I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan