Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 32:14 - Bible Nso

14 Miri-ara nke raru araru nke ìgwè ehi, na miri-ara nke ìgwè ewu na aturu, Ya na abuba umu-aturu, Na ebulu àb͕ọ̀ Beshan, na ewu, Tiyere abuba obi ọka wheat; Ọbara nkpuru-vine ka i nāṅu kwa, bú manya-vine.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ehi, na mmiri ara rahụrụ arahụ nke igwe ewu na atụrụ, na ụmụ atụrụ na mkpi gbara abụba, na oke ebule Bashan dị ezi mma, tinyere ezi obi ọka wiiti. Ị ṅụkwara mmanya na-agbọ ụfụfụ, nke bụ ọbara mkpụrụ vaịnị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 32:14
22 Iomraidhean Croise  

O were kwa miri-ara-ehi nke raru araru, na miri-ara-ehi, na nwa-ehi ahu nke o doziri, o che ha n'iru ha; ya onwe-ya we nēguzo n'akuku ha n'okpuru osisi ahu, ha we rie.


O nēlibe nwa-inyinya-ibu-ya n'osisi vine, O nēlibe kwa nwa nke nne-inyinya-ibu-ya n'osisi vine kachasi nma; Ọ suworo uwe-ya nime manya-vine, Su kwa ákwà-nb͕okwasi-ya n'ọbara nkpuru-vine:


na manu-aṅu, na miri-ara-ehi nke raru araru, na ìgwè ewu na aturu, na cheese nke ìgwè ehi, ka ha rie: n'ihi na ha siri, Agu nāgu ndi nka, ha nāda kwa mbà, akpiri nākpọ kwa ha nku, n'ọzara.


Ha we were obodo di iche iche ewusiri ike, na ala nwere ume, ha nweta-kwa-ra ulo juputara n'ezi ihe nile, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, na ubi-vine, na ubi-olive, na ọtutu osisi nāmi nkpuru anēri eri: ha we rie ihe, afọ ju-kwa-ra ha, ha we gba abuba, ezi ihe uku Gi we tọ ha utọ.


Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.


Ọ gaghi-ele miri-iyi anya, Bú osimiri miri-iyi nke manu-aṅu na miri-ara-ehi raru araru.


Mb͕e ewere miri-ara-ehi raru araru sa nzọ-ukwum nile, Mb͕e oké nkume nāwuputaram miri-iyi nke bu nání manu!


Ọ bu onye nēme ka ókè-ala-gi ghọ udo; Abuba ọka wheat ka O ji me ka i riju afọ.


Ọtutu oke-ehi dim buruburu: Oke-ehi di ike nke Beshan ab͕awom buruburu.


Ọ gēme kwa ka ha rie abuba ọka wheat: Ọ bu kwa manu-aṅu nke sitere n'oké nkume ka M'gēji nyeju gi afọ.


Miri-ara-ehi raruru araru na manu-aṅu ka nwa-okoro ahu gēri, mb͕e ọ mara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe.


ọ gēru kwa, site n'ọtutu miri-ara ha gāb͕a, na ọ gēri miri-ara raruru araru: n'ihi na miri-ara raruru araru na manu-aṅu ka onye ọ bula nke fọduru n'etiti ala nka gēri.


Anu-aru ndi-dike ka unu gēri, ọ bu kwa ọbara ndi-isi nke uwa ka unu gāṅu, nke ebulu, na nke umu-aturu, na nke ewu, na nke oké-ehi, anu gbara abuba nke Beshan ka ha nile bu.


Achirim udọ̀ madu, bú ihe-nhiegide ihu-n'anya, adọ ha; M'we diri ha dika ndi nēbuli yoke n'elu ab͕a-ha, anameseti kwa akam me ka ha rie ihe.


Nurunu okwu a, unu nne-ehi nke Beshan, ndi nọ n'ugwu Sameria, ndi nēmeb͕u ndi nēnweghi ike, ndi nāzọpia umu-ob͕eye, ndi nāsi ndi-nwe-ha, Wetanu, ka ayi ṅua.


Were nkpa-n'aka-Gi zùa ndi-Gi, bú ìgwè ewu na aturu nke ihe-nketa-Gi, ndi bi iche, n'oké ọhia n'etiti Kamel: ka ha ta nri nime Beshan na Gilead, dika n'ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Manu nile nke kachasi nma nke manu ọhu, na manya nile nke kachasi nma nke manya-vine ọhu, na ọka, bú ihe mbu ha nke ha nēnye Jehova, gi ka M'nyeworo ha.


n'ihi na i fèghi Jehova, bú Chineke-gi, òfùfè n'ọṅu, na n'obi-utọ, n'ihi iba-uba nke ihe nile:


Ewe zọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu n'azu obodo ahu, ọbara we si n'ebe-nzọcha-nkpuru-vine ahu puta, rue bridle inyinya, ru kwa ihe ra ka nnù furlong anọ.


Miri ka Sisera riọrọ, miri-ara-ehi ka ọ nyere ya; O weta nso ya miri-ara-ehi nke raru araru n'ọkwa ndi di ebube.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan