Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 32:12 - Bible Nso

12 Otú a Jehova, nání Ya, nēdu ya, Ọ dighi kwa chi ala ọzọ diyere ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Onyenwe anyị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 32:12
19 Iomraidhean Croise  

Ọ bu kwa ogidi igwe-oji ka I nēwere du ha n'ehihie; I nēwere kwa ogidi ọku n'abali, inye ha ìhè n'uzọ ahu nke ha gēje ije nime ya.


Ndi ahu, náni ha, ka enyere ala, Ọ dighi kwa ọbìa gabigara n'etiti ha:)


Kelenu Onye nēme ka ndi-Ya je ije n'ọzara: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ēbi ka ebere-Ya di.


Jehova, zím uzọ-Gi; Durukwam n'okporo-uzọ di lari, N'ihi ndi nēchem anwu.


O ji-kwa-ra igwe-oji edu ha n'ehihie, Ji kwa ìhè ọku edu ha ogologo abali nile.


Gi Onye nāzu Israel dika aturu, ṅa nti, Gi Onye nēdu Josef dika ìgwè ewu na aturu; Gi Onye bi n'etiti cherubim, nwuputa ka ìhè.


Ọ dighi chi ala ọzọ gādi nime gi; I gaghi-akpọ kwa isi ala nye chi mba ọzọ.


ọzọ, rue agadi Mu onwem bu Onye ahu, ru kwa isi-awọ Mu onwem gēku unu n'aka: Mu onwem emewo, Mu onwem gēbu kwa; e, Mu onwem gēku n'aka me kwa ka unu wepuga onwe-unu.


Dika anu-ulo nke nārida na ndagwurugwu, otú a ka Mọ nke Jehova nēme ka ha zuru ike: otú a ka I duru ndi-Gi, imere Onwe-gi aha mara nma.


Achirim udọ̀ madu, bú ihe-nhiegide ihu-n'anya, adọ ha; M'we diri ha dika ndi nēbuli yoke n'elu ab͕a-ha, anameseti kwa akam me ka ha rie ihe.


na n'ọzara, ebe i huworo na Jehova, bú Chineke-gi, kuru gi, dika nwoke si eku nwa-ya nwoke, n'uzọ ahu nile nke unu jere, rue mb͕e unu biaruru ebe a.


Ub͕u a, hunu na Mu onwem, Mu onwem bu Ya, Ọ dighi kwa chi ọzọ Mu na ya nọ: Mu onwem nēme ka anwua, M'nēme kwa ka adi ndu; M'tib͕uwo etib͕u, Mu onwem gēme kwa ka aru di ike: Ọ dighi kwa onye nānaputa n'akam.


Emewo ka gi onwe-gi hu ya, ka i we mara na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke; ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Ya;


I mawo kwa ta, cheta-kwa-ra obi-gi, na Jehova, Ya onwe-ya bu Chineke n'elu-igwe di n'elu na n'elu uwa di n'okpuru: ọ dighi onye ọzọ.


n'ihi na Jehova, bú Chineke-ayi, Ya onwe-ya bu onye mere ka ayi na nna-ayi-hà si n'ala Ijipt, si n'ulo ndi-orù, rigota, Onye me-kwa-ra ihe-iriba-ama uku ahu nile n'anya-ayi, debe ayi n'uzọ ahu nile nke ayi jere ije nime ya, na n'etiti ndi nile nke ayi gabigara n'etiti ha:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan