Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 31:9 - Bible Nso

9 Moses we de iwu a n'akwukwọ, were ya nye ndi-nchu-àjà, bú umu Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ọ nye kwa ndi-okenye nile nke Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Mgbe ahụ, Mosis depụtara iwu ndị ahụ niile nʼakwụkwọ, were ya nye ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ndị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị ahụ. Mosis nyekwara ndị okenye Izrel akwụkwọ a e dere iwu niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 31:9
29 Iomraidhean Croise  

Ndi-okenye nile nke Israel we bia, ndi-nchu-àjà we bulie ib͕e ahu.


ukpuru nile na ikpé nile na iwu na ihe enyere n'iwu, nke O dere n'akwukwọ nye unu, ndia ka unu gēlezi kwa anya ime ubọchi nile; ma unu atula egwu chi di iche iche ọzọ:


Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n'ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ezra, bú onye-nchu-àjà, we weta iwu ahu n'iru nkpọkọta Israel, ma ndikom ma ndinyom, ma onye ọ bula nke nāghọta inu ihe, n'ubọchi mbu nke ọnwa nke-asa.


O we gua nime ya n'iru amá nke di n'iru ọnu-uzọ-ama miri site oge ututu rue etiti-ehihie, n'iru ndikom na ndinyom na ndi nāghọta ihe; ndi ahu nile we ṅa nti akwukwọ iwu ahu.


Moses we de okwu Jehova nile n'akwukwọ, o bilie n'isi-ututu, wu ebe-ichu-àjà n'okpuru ugwu ahu, ya na ogidi iri na abua, dika ebo iri na abua nke Israel si di.


Dika edeworo ya n'akwukwọ iwu Moses, ihe ọjọ a nile abiakwasiwo ayi: ma ayi emeghi ka iru Jehova, bú Chineke-ayi, dajua, ka ayi we si n'ajọ omume nile ayi chigharia, nwe uche n'ezi-okwu-Gi.


Emewo ka ndim la n'iyì site n'enweghi ọmuma Chineke: n'ihi na gi onwe-gi ajuwo ọmuma ahu, M'gāju kwa gi, i we ghara iburum onye-nchu-àjà: i chezọwo kwa iwu nke Chineke-gi, M'gēchezọ kwa umu-gi, ọbuná Mu onwem.


N'ihi na eḅuḅere-ọnu abua nke onye-nchu-àjà gēdebe ihe-ọmuma, ọ bu kwa iwu ka ha gāchọ n'ọnu-ya: n'ihi na onye-ozi nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha ka ọ bu.


Chetanu iwu Moses, bú orùm, nke M'nyere ya n'iwu na Horeb inye Israel nile, bú ukpuru di iche iche na ikpé di iche iche.


Moses we de ọpupu nile ha n'akwukwọ dika nbuli-ije nile ha si di, n'okwu-ọnu Jehova: ndia bu kwa nbuli-ije-ha dika ọpupu nile ha si di.


Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute.


na nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū Eron gābà kwa nime, ya na umu-ya ndikom, ha gākwuda ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi ahu, were ya kpuchie ib͕e ihe-àmà ahu,


tiye kwa ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya, b͕akwasi kwa ákwà anunu anunu n'elu, tiye kwa nkpa-n'aka-ya abua nime


Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, Ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, rapu nwunye n'azu, ma ọ rapughi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.


si, Onye-ozizí, Moses dere akwukwọ nye ayi, si, na ọ buru na nwa-nne-nwoke onye ọ bula anwua, mb͕e o nwere nwunye, ma onye ahu enweghi nwa, ka nwa-nne-ya nwoke kuru nwunye-ya, me ka nkpuru toputara nwa-nne-ya.


N'ihi na esitere n'aka Moses nye iwu Chineke; amara na ezi-okwu sitere n'aka Jisus Kraist bia.


Filip we chọta Nataniel, si ya, Ayi ahuwo Onye Moses dere ihe bayere Ya n'akwukwọ iwu, Onye ndi-amuma dekwara ihe bayere Ya, Jisus Onye Nazaret, Nwa Josef.


N'ihi na ọ buru na unu kwere Moses, unu gēkwem; n'ihi na ya onwe-ya dere ihe bayerem n'akwukwọ.


Na mb͕e ahu ka Jehova kewaputara ebo Livai, ibū ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, iguzo n'iru Jehova ijere Ya ozi, na igọzi n'aha-Ya, rue ta.


Ọ gēru kwa, mb͕e ọ nānọkwasi n'oche-eze nke ala-eze-ya, na ọ gēdeputara onwe-ya iwu a n'akwukwọ, site n'akwokwọ ahu nke di n'iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai:


Kpọkọtaranum ndi-okenye nile nke ebo nile unu, na ndi-odozi-okwu-unu, ka m'kwu kwa okwu ndia na nti-ha, me ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide ha.


Ha gēzí Jekob ikpé-Gi nile, Iwu-Gi ka ha gēzí kwa Israel: Ha gētiye ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'imi-Gi, Tiye kwa àjà-nsuresi-ọku n'elu ebe-ichu-àjà-Gi.


ha we nye ndi Israel iwu, si, Mb͕e unu nāhu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, bú Chineke-unu, na ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ka ha nēbu ya, unu onwe-unu gēsi kwa n'ebe unu nọ bulie ije, we nējeso ya.


Joshua we bilie n'isi-ututu, ndi-nchu-àjà we būru ib͕e Jehova.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan