Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 31:21 - Bible Nso

21 O gēru kwa, mb͕e ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta ha, na abù a gāb͕a àmà n'iru ha dika ihe-àmà; n'ihi na agaghi-echezọ ya pua n'ọnu nkpuru-ha: n'ihi na amawom ncheputa-ha nke ndi ahu nēme ta, tutu Mu eme ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru iyi inye ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 31:21
16 Iomraidhean Croise  

Jehova we hu na ihe ọjọ nke madu riri nne n'uwa, Ọ hu kwa na ncheputa nile ọ bula nke echiche obi-ya bu nání ihe ọjọ ogologo ubọchi nile.


Jehova we nu ísì utọ ya; Jehova we gwa obi-Ya okwu, si, M'gaghi-akọcha ala ọzọ ma-ọli n'ihi madu, n'ihi na ncheputa nke obi madu di njọ site na nwata; M'gaghi-etib͕u kwa ihe nile ọ bula di ndu ọzọ ma-ọli, dika M'meworo.


Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè: n'ihi na nkpuru-obi nile ka Jehova nēnyocha, Ọ nāghọta kwa nchèputa nile ọ bula nke èchìchè: ọ buru na i chọ Ya, Ọ gēme ka i chọta Ya; ma ọ buru na i rapu Ya, Ọ gāju gi rue mb͕e ebighi-ebi.


Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya.


nēgosi ikpe-azu site na mbu, nēgosi kwa ihe nke anēmeghi eme site na mb͕e ochie; nāsi, Ndum-ọdum gēguzosi ike, ọ bu kwa ihe nile nke nātọm utọ ka M'gēme:


Mu onwem mara Efraim, Israel ezonarighkwam: n'ihi na ub͕u a i kwawo iko, Efraim, emeruwo Israel.


Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;


Onye a, ebe ewere Ya nye site n'ìzù akara àkà nke Chineke na ọmuma-ihe Chineke buru uzọ mara, Onye a ka unu kpọgidere n'obe b͕u kwa site n'aka ndi nāmaghi iwu-ayi:


ka ha me ihe nile, ka ha ra, bú nke aka-Gi na ìzù-Gi buru uzọ ka àkà ka ha puta.


egosiwom unu ta, na unu aghaghi ila n'iyì; unu agaghi-eme ka ubọchi-unu di anya n'elu ala ahu, ebe gi onwe-gi nāgabiga Jọdan ibà ka i nweta ya.


Moses we kpọ Joshua òkù, si ya n'anya Israel nile, Di ike, nwe kwa ume: n'ihi na gi onwe-gi gēsoro ndi nka ba n'ala ahu nke Jehova ṅuru ndi bu nna-ha iyi ínye ha; gi onwe-gi gēme kwa ka ha keta ya.


Mb͕e nkpab͕u diri gi, mb͕e ihe nile ndia abiakwasiwo-kwa-ra gi, na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia i gālaghachikuru kwa Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa olu-Ya nti:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan