Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 31:20 - Bible Nso

20 N'ihi na mb͕e M'gēmewori ka ha ba n'ala ahu nke M'ṅuru ndi bu nna-ha iyi, bú ala miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya; mb͕e ha gēriwo-kwa-ri ihe, afọ eju kwa ha, ha we ma abuba; ha gēche kwa chi ọzọ iru, fè ha òfùfè, we leliam anya, mebi kwa ọb͕ub͕a-ndum.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 31:20
26 Iomraidhean Croise  

Ha onwe-ha efèghi kwa Gi n'ala-eze-ha, na n'ezi ihe-Gi bara uba nke I nyere ha, na n'ala ahu sara mbara nke nwe-kwa-ra ume, nke I tiyere n'iru ha, ha esighi kwa n'omume ọjọ nile ha chigharia.


Obi-ha bu nání abuba dika abuba; Ma mu onwem, ihe iwu-Gi nātọm utọ nke-uku.


Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba: Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako.


Anya-ha esiwo n'abuba-ha guzoputa: Ntughari nile nke obi-ha agabigawo ókè.


M'we si, M'gēme ka unu si na nweda-n'ala nke Ijipt rigorue ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi-Perizait na ndi-Haivait na ndi Jebus, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya.


M'we ridata inaputa ha n'aka ndi Ijipt, na ime ka ha si n'ala ahu rigorue ala di nma nke sa-kwa-ra mbara, rue ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù na ya; rue ebe nke ndi Kenean, na ndi Het, na ndi-Amorait, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus.


Ka afọ we ghara ijum, m'we gọ agọ, si, Ònye bu Jehova? Ma-ọbu ka ewe ghara inapum ihe nile, m'we zu ori, We were aha Chinekem me ihe ọjọ.


Me ka obi ndi nka ma abuba, me kwa ka nti-ha di arọ́, techi kwa anya-ha; ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ, ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, ghara kwa iwere obi-ha ghọta, ghara kwa ichighari, ka aghara kwa ime ka aru di ha ike.


ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n'ubọchi M'jidere ha n'aka ime ka ha si n'ala Ijipt puta; n'ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ha amawo abuba, aru-ha eb͕uwo àmùmà: e, emebigawo ihe ọjọ ókè: ha ekpeghi ọnu, bú ọnu nke nwa-nb͕ei, ka o we gara ha nke-ọma; ọ bu kwa ikpe nke ndi-ob͕eye ka ha nādighi-ekpe.


N'ihi na unu nāṅuri ọṅu, n'ihi na unu nāṅuri ọṅu-agha, unu ndi nāpunara ihe-nketam ihe, n'ihi na unu nāwuli elu dika nwa-ab͕ọghọ-ehi nke nāzọcha ọka, unu nēbe kwa dika inyinya di ike;


Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, gēkpe kwa ikpe n'etiti anu mara abuba na anu tara aru.


Dika ọtita-nri-ha si di, otú a ka afọ juru ha; afọ juru ha, obi-ha we di elu; n'ihi nka ka ha chezọworom.


Ma ndi ahu agabigawo pua n'ọb͕ub͕a-ndum, dika Adam: n'ebe ahu ka ha ghọb͕uworom.


Lezienu onwe-unu anya, ka ewe ghara irafu obi-unu, unu ewe wezuga onwe-unu, fè chi ọzọ òfùfè, kpọ isi ala nye ha;


iwe Jehova we di ọku megide unu, O we b͕ochie elu-igwe, ka miri-ozuzo we ghara idi, ka ala we ghara kwa imi ihe-ọmume-ya; unu we si n'ezi ala ahu, nke Jehova nēnye unu, la n'iyì ngwa ngwa.


I gānu kwa, Israel, lezi kwa anya ime ya; ka o we diri gi nma, ka unu we ba kwa uba nke-uku, dika Jehova, bú Chineke nna-gi-hà, gwaworo gi okwu, n'ala nke miri-ara-ehi na manu-aṅu nērù nime ya.


Mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēme ka i ba n'ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya, mb͕e Ọ gēwepu kwa ọtutu mba n'iru gi, bu ndi Het, na ndi-Giagashait, na ndi-Amorait, na ndi Kenean, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, mba asa bara uba di kwa ike kari gi;


Ọ gēru kwa, ọ buru na i chezọ Jehova, bú Chineke-gi, we nējeso chi ọzọ, fè ha òfùfè, kpọ kwa isi ala nye ha, ab͕awom àmà megide unu ta na unu aghaghi ila n'iyì.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nēme ka i ba n'ezi ala, bú ala iyi miri, na nke isi-iyi na ob͕u-miri, nāputa na ndagwurugwu na n'ugwu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan