Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 31:18 - Bible Nso

18 Mu onwem aghaghi kwa izo irum n'ubọchi ahu n'ihi ihe ọjọ nile nke ha meworo, n'ihi na ha echewo chi di iche iche ọzọ iru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Aga m echepụ ihu m site nʼebe ha nọ nʼụbọchị ahụ, nʼihi ajọ omume ha nke ife chi ọzọ ofufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 31:18
11 Iomraidhean Croise  

Jenu, juaram Jehova ase, ju-kwa-ra ndi nkem, ju-kwa-ra Juda nile, bayere okwu nile nke akwukwọ a nke achọtaworo: n'ihi na ọnuma Jehova di uku, bú nke amuyeworo dika ọku megide ayi, n'ihi na nna-ayi-hà egeghi okwu nile nke akwukwọ a nti, ime dika ihe si di nke edeworo n'ihi ayi.


ka gi na ndi bi n'ala ahu we ghara ib͕a ndu, ha we so chi-ha nākwa iko, churu chi-ha àjà, otù onye ewe kpọ gi, i we rie ufọdu nime ihe àjà-ya;


Otú ọ di, i nughi; i maghi kwa; site kwa na mb͕e ochie nti-gi egheghi oghe: n'ihi na amaram na i nāghọb͕u nke-uku, ọzọ, Onye nējehie ejehie site n'afọ nne-ya, ka anākpọ gi.


N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Ọ dighi kwa onye nākpọku aha-Gi, nke nākpọte onwe-ya ijide Gi: n'ihi na I zonariwo ayi iru-Gi, we me ka ayi b͕aze site n'aka ajọ omume nile nke ayi.


Ha nābia ibuso ndi Kaldea agha, na imeju ha n'ozu madu ndi M'tib͕uworo n'iwem na n'ọnumam, ndi M'zonariwo-kwa-ra obodo a irum n'ihi ihe ọjọ nile ha.


Mba nile gāma kwa na ọ bu n'ihi ajọ omume-ha ka emere ka ulo Israel je biri n'ala ọzọ; n'ihi na ha mekpuru emekpu megidem, M'we zonari ha irum: M'we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we site na mma-agha, ha nile.


Ma ub͕u a, Derenu onwe-unu abù a, gi zí kwa ya umu Israel: tiye ya n'ọnu-ha, ka abù a we burum ihe-àmà megide umu Israel.


O we si, Ka M'zopu irum n'ebe ha nọ, M'gāhu ihe gābu ikpe-azu-ha: N'ihi na ọb͕ọ nke nāb͕akuta azu ka ha bu, Umu ndi nēkwesighi okwukwe.


Ọzọ kwa, ha egeghi nti ndi-ikpé-ha, n'ihi na ha soro chi ọzọ nākwa iko, we kpọ isi ala nye ha: ha siri n'uzọ ahu wezuga onwe-ha ngwa, bú nke ndi bu nna-ha jere nime ya, n'inu ihe nile Jehova nyere n'iwu; ma ha emeghi otú a.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan