Diuteronomi 31:12 - Bible Nso12 Kpọkọta ndi Israel, bú ndikom, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ka ha we nu, ka ha we muta kwa, we tua egwu Jehova, bú Chineke-unu, lezi kwa anya ime okwu nile nke iwu a; Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a12 Kpọkọta mmadụ niile nʼotu ebe, ndị ikom, na ndị inyom na ụmụntakịrị, na ndị ọbịa bi nʼetiti obodo unu, ka ha nụrụ, ma mụta ịtụ egwu Onyenwe anyị Chineke unu na ilezi anya ịgbaso okwu niile dị nʼiwu a. Faic an caibideil |
Israel nile, na ndi-okenye-ha, na ndi-ọchi-agha-ha, na ndi-ikpé-ha, nēguzo kwa n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke ib͕e ahu na ncherita-iru ndi-nchu-àjà, bú ndi Livai, ndi nēbu ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ma ọbìa ma onye amuru n'ala; nkera-ha na ncherita-iru ugwu Geraizim, nkera-ha ọzọ na ncherita-iru ugwu Ibal; dika Moses, bú orù Jehova, nyere iwu na mbu, igọzi ndi Israel.