Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?
N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.
N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.
Ọ gēru kwa, mb͕e ihe ndia nile gābiakwasi gi, bú ngọzi ahu na nkọcha ahu nke m'tiyeworo n'iru gi, mb͕e i gēme kwa ka ha biaghachi n'obi-gi n'etiti mba nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, nupuworo gi,
Emewom ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide unu ta, na ọ bu ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m'tiyeworo n'iru gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi:
N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.