Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 30:15 - Bible Nso

15 Le, etiyewom n'iru gi ta ndu na ezi ihe, na ọnwu na ihe ọjọ;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Lee, edoola m nʼihu gị taa ndụ na ọganihu, ọnwụ na ịla nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 30:15
18 Iomraidhean Croise  

ma nkpuru nke sitere n'osisi ima ezi ihe na ihe ọjọ, gi erila nkpuru sitere na ya: n'ihi na n'ubọchi i gēri nkpuru sitere na ya i ghaghi inwu anwu.


N'uzọ ezi omume ka ndu di; Ọzọ, n'uzọ nke okporo-uzọ-ya, ọ dighi ọnwu di ya.


Ọ buru na unu ekwe, we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri:


Ndi nka ka i gāsi kwa, Otú a ka Jehova siri: Le, M'nēche n'iru unu uzọ ndu na uzọ ọnwu.


m'we gosi unu ya ta; ma unu egeghi nti n'olu Jehova, bú Chineke-unu, ọbuná ime ihe ọ bula nke O zìrim ka m'were ya biakute unu.


Gi madu, O gosiwo gi ihe di nma; ọ̀ bu kwa gini ka Jehova nāchọ n'aka-gi, ma-ọbughi nání ime ihe ekpere n'ikpe, na ihu ebere n'anya, na iji obi-ume-ala soro Chineke-gi nēje ije?


Onye nke kwere, nke eme-kwa-ra ya baptism, agāzọputa ya; ma agāma onye nke nēkweghi ikpé.


N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.


N'ihi na nime Kraist Jisus ọ dighi ike ọ bula obibì-úgwù ma-ọbu ebìghi-úgwù nwere; kama nke nwere ike bu okwukwe nke sitere n'aka ihu-n'anya alusi ọlu ike.


Le, mu onwem nētiye n'iru unu ta ngọzi na nkọcha;


Ọ gēru kwa, mb͕e ihe ndia nile gābiakwasi gi, bú ngọzi ahu na nkọcha ahu nke m'tiyeworo n'iru gi, mb͕e i gēme kwa ka ha biaghachi n'obi-gi n'etiti mba nile, ebe Jehova, bú Chineke-gi, nupuworo gi,


Kama okwu ahu di gi ezi nso, n'ọnu-gi, na n'obi-gi, ka i we me ya.


Emewom ka elu-igwe na ala b͕a àmà megide unu ta, na ọ bu ndu na ọnwu, ngọzi ahu na nkọcha ahu, ka m'tiyeworo n'iru gi: gi rọrọ kwa ndu, ka i we di ndu, gi onwe-gi na nkpuru-gi:


N'ihi na ọ bughi ihe efu ka ọ bu n'ebe unu nọ; n'ihi na nka bu ndu-unu, ọ bu kwa ihe a ka unu gēwere me ka ubọchi-unu di anya n'elu ala, ebe unu onwe-unu nāgabiga Jọdan inweta ya.


Nka bu kwa ihe O nyere n'iwu, ka ayi kwere n'aha nke Ọkpara-Ya Jisus Kraist, hurita kwa onwe-ayi n'anya, dika O nyere ayi iwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan