Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 30:10 - Bible Nso

10 mb͕e i gēge nti olu Jehova, bú Chineke-gi, idebe ihe nile O nyere n'iwu na ukpuru-Ya nile nke edeworo n'akwukwọ iwu a; mb͕e i were obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, chigharikute Jehova, bú Chineke-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 30:10
17 Iomraidhean Croise  

ma asi na unu alaghachikutem, we debe ihe nile M'nyere n'iwu me kwa ha, ọ buru na ndi-unu anāchufu adi na nsọtu elu-igwe, site n'ebe ahu ka M'gāchikọta ha, me ka ha biarue ebe ahu nke M'rọputaworo ime ka aham biri n'ebe ahu.


Ma onye nēmebi iwu, mb͕e ọ gēsi na nmehie-ya nile nke o meworo chigharia, debe ukpurum nile, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, ọ ghaghi idi ndu, ọ gaghi-anwu.


Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


Ọzọ, mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume;


Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, n'ihi ihe ndia ka onye ahu gādi ndu.


Ndi nọ n'ebe di anya gābia kwa, wue n'ulo uku Jehova, unu ewe mara na Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezìwom biakute unu. Ọ gēme kwa, ọ buru na unu ege olu Jehova, bú Chinek-unu, nti nke-ọma.


kama eburum uzọ kọrọ ndi bi na Damaskọs akukọ, kọ kwa na Jerusalem, na nime ala Judia nile, kọ-kwa-ra ndi mba ọzọ, ka ha chègharia chigharikute kwa Chineke, nālu ọlu kwesiri nchèghari.


Ya mere chègharianu, chighari-kwa-nu, ka ewe hichapu nmehie nile unu, ka oge inwe ume ndu we si n'iru Onye-nwe-ayi bia otù a;


Obibì-úgwù abughi ihe, ebìghi-úgwù abughi kwa ihe; kama ọ bu idebe ihe nile Chineke nyere n'iwu.


Jehova gākpaputa kwa ya n'ebo nile nke Israel rue ihe ọjọ, dika ọb͕ub͕a-iyi nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke edeworo n'akwukwọ iwu a.


N'ihi na ihe a enyere n'iwu nke mu onwem nēnye gi 'niwu ta, ọ bughi ihe kariri gi ime ka ọ bu, ọ bughi kwa ihe diri gi anya ka ọ bu.


mb͕e i gēwere kwa obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile laghachikuru Jehova, bú Chineke-gi, ge kwa nti olu-Ya dika ihe nile si di nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, gi onwe-gi na umu-gi;


Gi onwe-gi gālaghachi kwa, ge nti olu Jehova, me ihe nile O nyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.


Ma asi na i si n'ebe ahu chọ Jehova, bú Chineke-gi, i gāchọta kwa Ya, mb͕e i were obi-gi nile na nkpuru-obi-gi nile jua ase Ya.


i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu Jehova, bú Chineke-gi, n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan