Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 3:18 - Bible Nso

18 M'we nye unu iwu na mb͕e ahu, si, Jehova, bú Chineke-unu, enyewo unu ala nka inweta ya: na njikere-agha ka unu gāgabiga n'iru umu-nne-unu, bú umu Israel, unu ndi-dìnkpà nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Enyekwara m unu iwu nʼoge ahụ sị, “Onyenwe anyị Chineke unu enyela unu ala a ka unu nwere ya. Ma ndị unu niile, ndị bụ dimkpa, ndị jikeere maka agha, ga-agafe nọrọ ndị Izrel ndị ọzọ nʼihu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 3:18
18 Iomraidhean Croise  

Ọ si ya, Mu onwem bu Jehova Nke mere ka i si n'Ua nke ndi Kaldea puta, inye gi ala nka inweta ya.


O we nye ala-ha ibu ihe-nketa: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di:


Unu gēnweta kwa ala ahu, biri nime ya: n'ihi na ọ bu unu ka M'nyeworo ala ahu inweta ya.


Ndia bu ukpuru ahu na ikpé ahu, nke unu gēlezi anya ime n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke nke nna-gi-hà, nyeworo gi ka i nweta ya, ubọchi nile nke unu onwe-unu nādi ndu n'elu ala ahu.


ma-ọbughi mb͕e ob͕eye nādighi n'etiti gi; (n'ihi na Jehova aghaghi igọzi gi n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi dika ihe-nketa ka i we nweta ya;)


Ewezugala ókè-ala ab͕ata-obi-gi, nke ndi mbu akpawo, n'ihe-nketa-gi nke i gēketa, n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i nweta ya.


i gākpaputara onwe-gi obodo atọ n'etiti ala-gi, nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, ka i we nweta ya.


N'ihi nka ka mu onwem nēnye gi iwu, si, I gākpaputara onwe-gi obodo atọ.


Mb͕e agāhuta otù onye eb͕uru eb͕u ka ọ dara n'ọhia n'ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ka i we nweta ya, ma amaghi onye tib͕uru ya:


O gēru kwa, mb͕e Jehova, bú Chineke-gi, gēmewori ka i pua n'aka ndi-iro-gi buruburu, zuru ike, n'ala nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi n'ihe-nketa, ka i we nweta ya, na i gēhichapu ncheta Amalek n'okpuru elu-igwe; echezọla.


Ma gi onwe-gi, guzo n'ebe a n'akukum, ka M'gwa kwa gi ihe ahu nile M'nyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke i gēzí ha, ka ha we me ha n'ala ahu nke Mu onwem nēnye ha ka ha nweta ya.


Ma nka bu ihe ahu enyere n'iwu, na ukpuru nile, na ikpé nile, nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere iwu ka ezí unu, ka unu we me ha n'ala ahu ebe unu onwe-unu nāgabiga inweta ya;


I mawo kwa na ọ bughi n'ihi ezi omume-gi ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi ezi ala nka ka i nweta ya; n'ihi na ndi kwesiri olu ike ka i bu.


Gabiganu n'etiti ọmuma-ulo-ikwū, nye ndi Israel iwu, si, Doziere onwe-unu ihe unu gēri n'uzọ; n'ihi na ọ fọduru ubọchi atọ unu ewe gabiga Jọdan nka, ibà nime inweta ala ahu nke Jehova, bú Chineke-unu, nēnye unu inweta ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan