Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 3:17 - Bible Nso

17 na Araba, na Jọdan, ka ọ buru ókè-ala, site na Kineret we rue oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'okpuru nkpọrube Pisga, n'akuku ọwuwa-anyanwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Oke ala ha nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bụ osimiri Jọdan nke dị nʼAraba. Oke ala a sitere na Kineret gbatịa ruo nʼOsimiri Araba (ya bụ Osimiri Nnu), nke dị na mgbada ugwu Pisga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 3:17
16 Iomraidhean Croise  

Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.


Ndia nile jikọtara onwe-ha n'otù na ndagwurugwu Sidim (nke ahu bu Oké Osimiri Nnú).


Onye ahu weghachiri ókè-ala Israel site na nbata Hemat rue oké osimiri Araba, dika okwu Jehova, bú Chineke Israel, si di, nke O kwuru site n'aka Jona nwa Amitai, bú onye-amuma, nke sitere na Gat-hefa.


O we sim, Miri ndia nāpu ga na buruburu-ala Iru-anyanwu, ha we rùda n'Araba, rùrue oké osimiri ahu; nime oké osimiri ahu ka miri ahu nke anēme ka ha puta gērùbà; ewe gwọ miri-ya.


Ọ we kuru ya je ọhia Zofim, rue elu Pisga, o wue ebe-ichu-àjà asa, sure otù oke-ehi na otù ebulu ọku n'ebe-ichu-àjà ọ bula.


Ma o rue, mb͕e ìgwè madu nādagide Ya nānu kwa okwu Chineke, na Ya onwe-ya nēguzo n'usọ ọdọ-miri Genesaret;


na Araba nile n'ofè Jọdan n'uzọ ọwuwa-anyanwu, we rue oké osimiri nke Araba, n'okpuru nkpọrube Pisga.


na Araba ahu rue oké osimiri Kinerot, n'akuku ọwuwa-anyanwu, ru kwa oké osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú, n'akuku ọwuwa-anyanwu, n'uzọ ije Bet-jeshimot; na na Ndida, n'okpuru nkpọrube Pisga:


na nime ndagwurugwu ahu, Bet-heram, na Bet-nimra, na Sukot, na Zafon, bú nke fọduru nke ala-eze Saihon, bú eze Heshbon, Jọdan na ókè-ala-ya, rue nsọtu oké osimiri Kineret n'ofè Jọdan n'akuku ọwuwa-anyanwu.


Ókè-ala Ndida nke ha nwere we di site na nsọtu Oké Osimiri Nnú, site n'ọnu-miri nke nēche iru na Ndida:


Ókè-ala ọwuwa-anyanwu we buru Oké Osimiri Nnú, rue nsọtu Jọdan. Ókè-ala akuku Ugwu we site n'ọnu-miri nke oké osimiri ahu na nsọtu Jọdan:


ókè-ala ahu we gabiga rue akuku Bet-họgla n'akuku Ugwu: ọpupu ókè-ala ahu di kwa n'ọnu-miri Ugwu nke Oké Osimiri Nnú, na nsọtu Ndida nke Jọdan; nka bu ókè-ala Ndida.


Obodo ewusiri ike bu Zidim, na Zea, na Hamat, na Rakat, na Kineret;


na miri ahu nke nēsi n'elu rida guzoro, we bilie n'otù obo, n'ebe di anya nke-uku, n'Adam, bú obodo nke di n'akuku Zaretan: ebìpusi-kwa-ra miri nke nērudata rue osimiri Araba, bú Oké Osimiri Nnú: ndi Israel we gabiga na ncherita-iru Jeriko.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan