Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 29:5 - Bible Nso

5 Emewokwam ka unu je ije ọgu arọ abua n'ọzara: uwe-unu akapughi nká n'aru unu, akpukpọ-ukwu-gi akapughi nká n'ukwu-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma Onyenwe anyị na-asị, “Nʼime iri afọ anọ ndị ahụ nke m duuru unu nʼime ọzara, uwe unu emeghị ochie, akpụkpọụkwụ unu akapụghị nʼụkwụ unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 29:5
13 Iomraidhean Croise  

Ọ bu kwa ọgu arọ abua ka I zùru ha n'ọzara, ọ dighi kwa ihe kọrọ ha; uwe-ha akaghi nká, ukwu-ha azaghi kwa aza.


O we me ka manna zokwasi ha dika miri, ka ha rie, Ọ bu kwa ọka nke elu-igwe ka O nyere ha.


M'gēwere kwa unu n'Onwem ka unu buru otù ndi, M'gābu-kwa-ra unu Chineke: unu gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-unu, Nke nēme ka unu si n'okpuru ibu nile nke ndi Ijipt puta.


Moses b͕ara ọgu arọ anọ, Eron b͕a-kwa-ra ọgu arọ anọ na atọ, mb͕e ha gwara Fero okwu.


Umu-unu gābu kwa ndi-ọzùzù-aturu n'ọzara ọgu arọ abua, ha gēbu kwa ọkwukwa-iko nile unu, rue mb͕e ozu-unu gāgwusi n'ọzara.


unu anatala àkpà iwere ga ije-unu, ma-ọbu uwe-ime abua, ma-ọbu akpukpọ-ukwu, ma-ọbu nkpa-n'aka: n'ihi na onye-ọlu kwesiri ihe eji azù ya.


O rue, n'arọ nke-ọgu-abua, n'onwa nke-iri-na-otù, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na Moses gwara umu Israel okwu, dika ihe nile Jehova nyere ya n'iwu inye ha si di;


I gēcheta kwa uzọ nile nke Jehova, bú Chineke-gi, mere gi ka i je ọgu arọ abua ndia n'ọzara, ka O we weda gi n'ala, inwa gi, ka O we mara ihe nke di n'obi-gi, ma i gēdebe ihe nile O nyere n'iwu, ma-ọbu na i gaghi-edebe.


O we weda gi n'ala, me ka agu gua gi, O we me ka i rie manna ahu, nke i nāmaghi, nke nna-gi-hà nāmaghi kwa; ka O we me ka i mara na ọ bughi nání achicha ka madu gēji di ndu, kama ọ bu ihe nile ọ bula nke nēsi n'ọnu Jehova puta ka madu gēji di ndu.


Uwe-nb͕okwasi-gi akapughi nká n'aru gi, ukwu-gi azaghi kwa aza, ọgu arọ abua ndia.


karama-akpukpọ manya-vine ndia, nke ayi b͕ajuru, di kwa ọhu; ma, le, ha dọwara adọwa: uwe-ayi na akpukpọ-ukwu-ayi ndi a akawo kwa nká site n'ije di ogologo nke-uku.


akpukpọ-ukwu kara nká, nke ab͕ara ab͕a, di kwa n'ukwu-ha, uwe kara nká di kwa n'aru ha; achicha nile nke ihe ha nēri n'uzọ kpọ-kwa-ra nku, ma kwa ebu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan