Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 29:24 - Bible Nso

24 ọbuná mba nile ahu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova meworo ala nka otú a? gini bu isi idi-ọku iwe uku a?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mba niile ga-ajụ sị, “Gịnị mere Onyenwe anyị ji mee ihe dị otu a nʼala a? Gịnị kpatara oke iwe ọkụ a?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 29:24
16 Iomraidhean Croise  

Ha we ju ukpuru-Ya nile, na ọb͕ub͕a-ndu-Ya nke Ya na ndi bu nna-ha b͕ara, na ihe-àmà-Ya nile nke Ọ b͕ara ha; ha we jeso ihe-efu, we ghọ ihe-efu, soro mba ọzọ ndi nọ ha buruburu, ndi Jehova nyere ha iwu bayere ha, ka ha ghara ime dika ha.


n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova, bú Chineke-ha, we gabiga ọb͕ub͕a-ndu-Ya, bú ihe nile nke Moses, bú orù Jehova, nyere n'iwu, ha anughi kwa ya, ha emeghi kwa ya.


Ma unu onwe-unu ndi nārapu Jehova, ndi nēchezọ ugwu nsọm, ndi nēdoro Gad table n'usoro, ndi nāb͕ajuru Meni manya gwara ọgwa;


O gēru kwa, mb͕e i gēgosi ndi nka okwu ndia nile, ha ewe si gi, N'ìhi gini ka Jehova kwuworo ihe ọjọ uku a nile megide ayi? ma-ọbu gini bu ajọ omume-ayi? ma-ọbu gini bu nmehie-ayi nke ayi mehieworo megide Jehova, bú Chineke-ayi?


ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara n'ubọchi M'jidere ha n'aka ime ka ha si n'ala Ijipt puta; n'ihi na ha onwe-ha mebiri ọb͕ub͕a-ndum ahu, ọ bu ezie na Mu onwem bu di nwe ha; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Onye-isi ndi-ob͕ū we were Jeremaia, si ya, Jehova, bú Chineke-gi, kwuru ihe ọjọ a megide ebe a:


Ọ gēru kwam mb͕e unu gāsi, N'ìhi gini ka Jehova, bú Chineke-ayi, meworo ayi ihe nile ndia? na i gāsi ha, Dika unu rapurum, we fè chi di iche iche nke ala ọzọ n'ala-unu, otú a ka unu gēfè ndi ala ọzọ n'ala nābughi nke unu.


Ndi-eze uwa ekweghi, ndi nile bi n'elu-uwa dum madu bi ekweghi kwa, Na onye-nkpab͕u na onye-iro gābà n'ọnu-uzọ-ama nile nke Jerusalem.


Ha gākasi kwa unu obi, mb͕e unu nāhu uzọ-ha na omume nile ha: unu ewe mara na ọ bughi n'efu ka M'meworo ihe ahu nile nke M'meworo nime ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Emesowom i ọbuná otú i meworo, gi onye ledaworo ọb͕ub͕a-iyi anya n'imebi ọb͕ub͕a-ndu.


Mu onwem gēme kwa ala-unu ka ọ tọb͕ọrọ n'efu: ibobo ya gānwu kwa ndi-iro-unu n'aru, bú ndi di nime ya.


ma dika obi-etili-gi na obi-gi nēchègharighi si di i nākpado iwe nye onwe-gi n'ubọchi iwe na nkpughe nke ikpé ziri ezi nke Chineke;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan