Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 29:16 - Bible Nso

16 (n'ihi na unu onwe-unu mara otú ayi biri n'ala Ijipt; na otú ayi gabigara n'etiti mba nile nke unu gabigara agabiga;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 29:16
8 Iomraidhean Croise  

M'we si ha, Tufuenu, onye ọ bula ihe-árú nile nke anya-ya abua, unu eji-kwa-la arusi nile nke Ijipt merua onwe-unu; Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


ma mb͕e i nābiaru nso ncherita-iru umu Amon, akpab͕ula ha, aluso-kwa-la ha ọ̀gù: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala umu Amon ka ọ buru ihe-nnweta: n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ibu ihe-nnweta.


Bilienu, bulie ije, gabiga ndagwurugwu Anon: le, enyewom Saihon onye-Amorait, bú eze Heshbon, na ala-ya, n'aka-gi: malite inweta ya, luso kwa ya ọ̀gù n'agha:


Gi nye kwa ndim iwu, si, Unu onwe-unu nāgabiga n'ókè-ala umu-nne-unu, bú umu Isọ, ndi bi na Sia; ha gātu kwa egwu unu: ma unu gēlezi onwe-unu anya nke-uku:


Jehova we sim, Akpab͕ula Moab, aluso-kwa-la ha ọ̀gù n'agha: n'ihi na M'gaghi-enye gi ala sitere n'ala-ya ibu ihe-nnweta; n'ihi na umu Lot ka M'nyeworo ya ka ọ buru ihe-nnweta.


kama ọ bu onye nọ n'ebe a n'etiti ayi nēguzo ta n'iru Jehova, bú Chineke-ayi, ọ bu kwa onye nānọghi n'ebe a n'etiti ayi ta:


unu ahuwo kwa ihe-árú nile ha, na arusi nile ha, bú osisi na nkume na ọla-ọcha na ọla-edo, nke di n'etiti ha:)


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan