Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 29:11 - Bible Nso

11 umu-ntakiri-unu, na ndinyom-unu, na ọbìa-gi nke nọ n'etiti ọmuma-ulo-ikwū-gi nile, site n'onye nāwa nkú-gi rue onye nēsere miri-gi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 29:11
16 Iomraidhean Croise  

O we so ha je. Ha we biarue Jọdan, b͕utue osisi.


Ha we ba nime ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú iwere obi-ha nile na nkpuru-obi-ha nile chọ Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha;


Jehoiada we me ọb͕ub͕a-ndu nke di n'etiti ya na ndi Juda nile na eze, na ha gābu ndi Jehova nwere.


ọzọ kwa, na ayi agaghi-enye ndi di iche iche nke ala ahu umu-ayi ndinyom, na ayi agaghi-aluta-kwa-ra umu-ayi ndikom umu-ha ndinyom:


Ọzọ kwa, ọtutu ndi gwara ọgwa soro ha rigo; na ìgwè ewu na aturu, na ìgwè ehi, anu-ulo riri nne nke-uku.


I we chiri umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi i muworom, i we chiri ha chuara ha àjà, ka ewe ripia ha. Ọ̀ bu ihe ntà, bú okwu ikwa-iko-gi nile,


Ìgwè ndi gwara ọgwa nke nọ n'etiti ha we chọ ajọ ọchichọ: umu Israel we kwa kwa ákwá ọzọ, si, Ònye gēme ka ayi rie anu?


Onye-Ju ma-ọbu onye-Grik apughi idi, orù ma-ọbu onye nwe onwe-ya apughi idi, nwoke na nwanyi apughi idi: n'ihi na unu onwe-unu nile bu otù onye nime Kraist Jisus.


Unu onwe-unu nēguzo ta, unu nile, n'iru Jehova, bú Chineke-unu; ndi-isi-unu, na ebo nile unu, na ndi-okenye-unu, na ndi-odozi-okwu-unu, bú nwoke ọ bula nke Israel,


ka i we gabiga ba n'ọb͕ub͕a-ndu nke Jehova, bú Chineke-gi, na n'iṅu-iyi-Ya, nke gi na Jehova, bú Chineke-gi, nāb͕a ta:


ma ubọchi nke-asa bu ubọchi-izu-ike nke Jehova, bú Chineke-gi, nwere: i gaghi-eje ozi ọ bula nime ya, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na ehi-gi, na inyinya-ibu-gi, na anu-ulo-gi nile, na ọbìa-gi nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi ọ bula; ka orù-gi nwoke na orù-gi nwayi we zuru ike dika gi onwe-gi nēzu.


ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile.


Joshua na ndi Israel we b͕a ndu ubọchi ahu, o we doro ha ukpuru na ikpé nime Shekem.


Ọ dighi okwu ọ bula n'ihe nile nke Moses nyere n'iwu nke Joshua nāgughi n'iru nkpọkọta nile nke Israel, na ndinyom, na umu-ntakiri, na ndi-ọbìa ndi nēje ije n'etiti ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan