Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 28:67 - Bible Nso

67 I gāsi n'ututu, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ọ bu anyasi! i gāsi kwa n'anyasi, Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na ọ bu ututu! n'ihi oké egwu nke obi-gi nke i gātu, na n'ihi ihe-ọhuhu anya-gi nke i gāhu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

67 Nʼụtụtụ, ị ga-asị, “Ewoo, a sịkwa na ugbu a bụ uhuruchi!” Nʼuhuruchi ị ga-asịkwa, “Ewoo, a sịkwarị na ugbu a bụ ụtụtụ!” Ị ga-ekwu ihe ndị a nʼihi ihe egwu juru gị obi, na nʼihi ihe ndị ahụ niile anya gị na-ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 28:67
6 Iomraidhean Croise  

Obim akpafuwo, oké ọma-jijiji emewo ka m'tua egwu nke-uku: chi-ojiji nke dim ezi nma ka o meworo ka ọ ghọrọm ima-jijiji.


i we buru onye nāwi ara n'ihi ihe-ọhuhu anya-gi abua, nke i gāhu.


ndu-gi ganākwu kwa èfè n'iru gi; i gātu kwa oké egwu abali na ehihie, i gaghi-eji kwa ndu-gi aka:


Jehova gēme kwa ka i were ub͕ọ laghachi n'Ijipt, n'uzọ nke m'siri gi, I gaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli: unu gēwere kwa onwe-unu renye ndi-iro-unu n'ebe ahu ibu orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, ma onye-ọb͕ub͕a agaghi-adi.


N'ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan