Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 28:63 - Bible Nso

63 Ọ gēru kwa, na dika obi tọrọ Jehova utọ n'aru unu ime unu nma, na ime ka unu ba uba; otú a ka obi gātọ Jehova utọ n'aru unu ime ka unu la n'iyì, na ikpochapu unu; ewe ropu unu n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

63 Dịka mmụba ị mụbara nʼọnụọgụgụ, na ịdị ukwuu nke akụnụba gị si bụrụ ihe nyere Onyenwe anyị obi ụtọ, otu a ka ọ ga-esi tọkwaa ya ụtọ ibibi gị, na ime ka ị daa ụkpa. Ọ ga-esi nʼala ahụ ị na-aga inweta hopu gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 28:63
29 Iomraidhean Croise  

Jehova we si, M'gēkpochapu madu n'elu ala, bú ndi M'keworo; ma madu, ma anu-ulo, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: n'ihi na echeghariwom na emerem ha.


Onye di nma ka I bu, na Onye nēme nma; Zím ukpuru-Gi nile.


Mu onwem kwa, na nhuju-anya-unu m'gāchì ọchì; M'gākwa emò mb͕e oké egwu-unu nābia;


Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa, Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.


N'ihi nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Onye di ike nke Israel, puta,) A, M'ga-akasi Onwem obi site na ndi nēmegidem, M'gābọ-kwa-ra Onwem ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom:


M'we si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi? O we si, Rue mb͕e obodo nile tọb͕ọrọ n'efu nēnweghi onye-obibi, ulo nile kwa, nēnweghi madu; rue mb͕e emeworo ka ala ndi ahu tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ebe tọb͕ọrọ n'efu,


N'ihi na dika nwa-okorọbia si aluru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, otú a ka umu-gi ndikom gālu gi: ọzọ, dika obi-utọ nke onye nālu nwunye ọhu nwere n'aru nwunye ọhu ya, otú a ka obi gātọ Chineke utọ n'aru gi.


N'otù ntabi-anya ahu mb͕e M'nēkwu okwu bayere mba ọ bula, iropu ya na ikwada ya na ime ka ọ la n'iyì;


N'ihi na M'gātukwasi ha anyam ime ha nma, M'gēme kwa ka ha lata n'ala nka: M'gēwu kwa ha dika ulo, ghara ikwada ha; M'gāku kwa ha dika osisi, ghara iropu ha.


Ọ gēru kwa na, dika M'muworo anya n'aru ha iropu na ikwada, na itikpọ na ime ka ala n'iyì, na imejọ; otú a ka M'gāmu anya n'aru ha iwu ulo na iku ihe n'ubi; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ndagwurugwu ahu nile nke ozu, na nke ntu, na ọzara nile rue miri-iyi Kidron, rue nkuku ọnu-uzọ-ama inyinya n'akuku ọwuwa-anyanwu, gābu ihe nsọ Jehova nwere; agaghi-eropu ya, agaghi-etikpọ kwa ya ọzọ rue mb͕e ebighi-ebi.


Obi gātọkwam utọ n'aru ha ime ha nma, M'gēji kwa obim nile, ji kwa nkpuru-obim nile, kua ha n'ala nka n'ezie dika osisi.


Ọ buru na unu ebiri n'ala nka, M'gēwu kwa unu dika ulo, ghara ikwada unu, M'gāku kwa unu dika osisi, ghara iropu unu: n'ihi na echeghariwom n'ihe ọjọ ahu nke M'meworo unu.


si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:


Otú a ka i gāsi ya, Otú a ka Jehova siri: Le, ihe nke M'wuworo ka Mu onwem nākwada, ọzọ, ihe nke M'kuworo n'ubi ka Mu onwem nēropu; ọbuná ala nka nile, nkem ka ọ bu.


Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha: Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi; Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.


Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


Ewe mezue iwem, M'gēme kwa ka ọnumam zuru ike n'aru ha, ewe kasiem obi: ha gāmara kwa na Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu n'ekworom, mb͕e M'gēmezuwori ọnumam n'aru ha.


Anọm nēlegide mpi iri ahu, ma, le, otù mpi ọzọ, nke di ntà, rigotara n'etiti ha, ewe ropu mpi atọ nime mpi iri mbu n'iru ya: ma, le, anya di iche iche, dika anya madu, di na mpi a, na otù ọnu nke nēkwu oké ihe di iche iche.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Obodo ahu nke chiri nnù ndi-agha abua na ọgu iri apu gēnwe ọgu ise fọduru, nke chiri ọgu ise apu gēnwe kwa iri fọduru ulo Israel.


Ònye bu Chineke dika Gi, Nke nēbupu ajọ omume, nāgabiga kwa njehie nke diri ndi ala-nketa-Ya fọduru? O jigideghi iwe-Ya rue mb͕e ebighi-ebi, n'ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu.


Jehova, bú Chineke-gi, nọ n'etiti gi, Ọ bu dike nke nāzọputa: O gēji ọṅù nwe obi-utọ n'aru gi, Ọ gedere du n'ihu-n'anya-Ya, Ọ gēji iti-nkpu-ọṅù teghari egwu ọṅù n'aru gi.


Ma ayi aghaghi ime ka obi tọ ayi utọ na iṅuri ọṅu: n'ihi na nwa-nne-gi nka nwururi anwu, o we di ndu ọzọ; o fukwara efu, ewe hu ya.


Jehova, bú Chineke-gi, gēme kwa ka i babiga uba okè n'omume nile nke aka-gi, nime nkpuru nke afọ-gi, na nime nkpuru nke anu-ulo-gi, na nime nkpuru nke ala-ubi-gi, bayere ezi ihe: n'ihi na obi gātọ kwa Jehova utọ ọzọ n'aru gi ime gi nma, dika obi tọrọ Ya utọ n'aru nna-gi-hà:


Jehova gēme kwa ka unu b͕asa n'etiti ndi nile, unu gāfọdu kwa ndikom ole-na-ole n'etiti mba nile ọzọ, ebe Jehova gēduga unu.


Ma Jehova, bú Chineke-gi, gēwepu mba ahu n'iru-gi nke-ntà nke-ntà: i pughi ime ka ha gwusia ngwa ngwa, ka anu-ọhia ghara iba uba megide gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan