Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 28:57 - Bible Nso

57 na n'aru ichi-ya nke nēsi apata ukwu-ya puta, na n'aru umu-ya nke ọ nāmu; n'ihi na ọ gēri ha na nzuzo n'ukọ ihe nile: nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

57 ọ bụladị akpanwa si nʼetiti ụkwụ ya pụta na ụmụ ọhụrụ ọ mụrụ. Nʼọnọdụ ọjọọ nʼoke ụkọ ya, ọ chọrọ iri ha na nzuzo, nʼihi ahụhụ nke ndị iro gị mere ka ọ bịakwasị gị nʼoge nnọchigide nke obodo gị niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 28:57
6 Iomraidhean Croise  

Nkpa-n'aka eze agaghi-esi n'ebe Juda nọ wezuga onwe-ya, Nkpa-n'aka onye nēnye ukpuru agaghi-esi kwa n'etiti ukwu-ya abua wezuga onwe-ya, Rue mb͕e Shailo gābia; Ọ bu kwa ya gēnwe iṅa-nti ndi di iche iche.


Eze we si ya, Gini nēme gi? Ọ si, Nwayi a sirim, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya ta, nwam nwoke ka ayi gēri kwa echi.


Ayi we sie nwam nwoke, rie ya: m'we si ya n'ubọchi soro ya, Nye nwa-gi nwoke, ka ayi we rie ya: ma o zowo nwa-ya nwoke.


Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.


Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite; Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.


I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan