Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 28:53 - Bible Nso

53 I gēri kwa nkpuru nke afọ-gi, bú anu-aru umu-gi ndikom na umu-gi ndinyom, ndi Jehova, bú Chineke-gi, nyeworo gi; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-gi nākpab͕u gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

53 Ị ga-erikwa anụ ahụ ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom ndị Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị nʼihi oke nnọchigide nke ndị agha nọchigidere gị na nʼihi oke mkpagbu nke ndị iro.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 28:53
11 Iomraidhean Croise  

M'gēme kwa ka ha rie anu-aru nke umu-ha ndikom na anu-aru umu-ha ndinyom, ha gēri kwa, onye ọ bula anu-aru ibe-ya, nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-ha na ndi nāchọ ndu-ha nākpab͕u ha.


Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya! Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n'aka? Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n'ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi?


Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite; Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.


N'ihi nka ka ndi bu nna gēri umu-ha n'etiti gi, umu gēri kwa ndi bu nna-ha; M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe nime gi, M'gāb͕asa kwa ndi-gi nile fọduru nye ifufe nile.


Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa.


Ma ahuhu gādiri ndi di ime na ndi nēnye nwa ara na mb͕e ahu.


Ihe anābu ọnu ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi.


Nwoke nke di nro n'etiti gi, nke di kwa pekepeke nke-uku, anya-ya gājọ njọ n'aru nwa-nne-ya, na n'aru nwunye nke obi-ya, na n'aru umu-ya fọduru nke ọ kwere ka ha fọdu:


ọ we ghara inye onye ọ bula nime ha ufọdu nime anu-aru umu-ya nri ọ ga-eri, n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula fọduru ya; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.


na n'aru ichi-ya nke nēsi apata ukwu-ya puta, na n'aru umu-ya nke ọ nāmu; n'ihi na ọ gēri ha na nzuzo n'ukọ ihe nile: nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan