Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 28:35 - Bible Nso

35 Jehova gēwere ihe-otiti ọjọ, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya, tie gi n'ikperè-ukwu-gi abua na n'ogwe-ukwu-gi abua, site n'ọbu-ukwu-gi we rue opu-n'isi-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Onyenwe anyị ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 28:35
8 Iomraidhean Croise  

Ma n'Israel nile ọ dighi nwoke mara nma dika Absalom anētò nke-uku: site n'ọbu-ukwu-ya we rue opu-n'isi-ya ọlu adighi n'aru-ya.


Site n'ọbu-ukwu we rue isi ọ dighi izu-okè di nime ya; kama ob͕ub͕u-mma, na itiru-aru, na ọnyá etiputara ọhu: apikọtaghi ha, ekechighi kwa ha, ejighi kwa manu me ka ha di nrò.


n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.


Ọ gēru kwa, na n'ọnọdu uda ọma ire-ure gādi; n'ọnọdu ihe ike n'úkwù udọ̀ gādi; n'ọnọdu agiri-isi akpara nke-ọma nkwọcha-isi gādi; n'ọnọdu ákwà ọma ihe-ọkiké nke ákwà-nkpe gādi: eb͕ub͕u-ọku gādi n'ọnọdu ima-nma.


Jehova gēwere ihe-ofifi Ijipt, were kwa emerod, were kwa àb͕à, were kwa ọkọ, tib͕ue gi, nke anāpughi ime ka aru-gi di nma na ya.


i we buru onye nāwi ara n'ihi ihe-ọhuhu anya-gi abua, nke i gāhu.


Mọ-ozi mbu we je, wusi ọkwa-ya nime uwa; ajọ ọnyá jọb͕uru onwe-ya we puta n'aru madu nile ndi nwere akàrà anu-ọhia ahu, ndi nākpọ kwa isi ala nye ihe-oyiyi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan