Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 28:29 - Bible Nso

29 i gāsọghari kwa ìsì n'etiti ehihie, dika onye-ìsì nāsọghari n'ọchichiri, i gaghi-eme kwa ka ije-gi ọ bula ga nke-ọma: i gābu kwa nání onye anēmeb͕u na onye anānapu ihe-ya n'ike ubọchi nile, onye-nzọputa adighi kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ị ga-asọgharị isi nʼetiti ehihie dịka onye kpuru ìsì nʼasọgharị nʼọchịchịrị. Ọ dịghị ihe ọbụla ga-agara gị nke ọma. Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ị ga-abụ onye a na-emegbu emegbu, na onye a na-anapụ ihe ya nʼike oge niile, na-enweghị onye ga-anapụta gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 28:29
26 Iomraidhean Croise  

Ha we were ikpu-ìsì tie ndikom ahu ndi nọ n'ọnu-uzọ ulo, ma onye ntà ma onye uku: ike we gwu ha ichọta ọnu-uzọ ahu.


Ọ nēme-kwa-ra ndi-eze ọtutu ihe-ọmume, bú ndi I doro ndi-isi-ayi n'ihi nmehie nile ayi: ha nāchi kwa aru-ayi, na n'etiti anu-ulo-ayi, dika ọ nātọ ha utọ, ọ bu kwa na nkpab͕u uku ka ayi nọ.


Ha nāsọghari ìsì n'ọchichiri nēnweghi ìhè, O we me ka ha kpafue dika onye ṅubigaworo manya ókè.


N'ehihie ka ha nēzute ọchichiri, Ha nāsọghari kwa ìsì n'etiti-ehihie, dika n'abali.


Jehova we si Moses, Setipu aka-gi n'iru elu-igwe, ka ọchichiri we b͕a n'elu ala Ijipt, bú ọchichiri agēbitu aka.


Ayi nāsọghari ìsì na mb͕idi dika ndi-ìsì, e, ayi nāsọghari ìsì dika ndi nēnweghi anya: ayi asuwo ngọngọ n'etiti-ehihie dika ọ bu chi-ojiji; n'etiti ndi nwere ezi ndu ayi nọ ka ndi nwuru anwu.


N'ihi na olu nke igo-ákwá ka anuworo site na Zaion, Le ka esi bibisia ayi nke-uku! ihere emewo ayi nke-uku, n'ihi na ayi arapuwo ala-ayi, n'ihi na ha atudawo ebe-obibi nile ayi.


Ha aṅaghariwo dika ndi-ìsì n'èzí nile, ejiwo ọbara meru ha, Madu we ghara inwe ike imetu uwe-ha aka.


N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma; N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.


Ndi-orù achiwo ayi: Ọ dighi onye nānaputa ayi n'aka-ha.


M'gēme kwa ka nkpà kpa madu, ha ewe jegharia dika ndi-ìsì, n'ihi na ọ bu Jehova ka ha mehieworo megide: agāwusi kwa ọbara-ha dika ájá, wusi kwa anu-aru-ha dika ǹsí.


kuru ndia tiyere onwe-gi, me ka gi na ha di ọcha, kwu-kwa-ra ha ugwọ ihe ha ji chu àjà, ka ha we kọpu isi: madu nile gāmara kwa na ezi-okwu adighi n'ihe ejiwo okwu-ọnu zí ha bayere gi; kama na gi onwe-gi nāgazi kwa, nēdebe iwu-ayi.


N'ihi na achọghm ka unu ghara ima ihe-omimi a, umu-nnam, ka unu ghara inwe uche n'anya onwe-unu, na emewo Israel obi-etili ufọdu, rue mb͕e ozùzù ndi mba ọzọ gābata;


Jehova gēwere ara-ọwiwi, were kwa ikpu-ìsì, were kwa ihe ngbu nke obi, tib͕ue gi:


Ha we tipia, kpab͕u kwa umu Israel arọ ahu: arọ iri na asatọ ka ha kpab͕uru umu Israel nile ndi bi n'ofè Jọdan, n'ala ndi-Amorait, nke di na Gilead.


Umu Israel we me kwa ihe ọjọ n'anya Jehova ọzọ; Jehova we nye ha n'aka ndi Filistia ọgu arọ abua.


Umu Israel we fè Eglon, bú eze Moab, òfùfè arọ iri na asatọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan