Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 28:18 - Bible Nso

18 Ihe anābu ọnu ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu-gi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 28:18
14 Iomraidhean Croise  

Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya! Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n'aka? Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n'ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi?


Mb͕e M'gākpajiri unu nkpa-n'aka-unu, bú achicha, ndinyom iri gēsi achicha-unu n'otù ite-ọku, ha gēweghachi kwa achicha-unu n'ọtùtù: unu gēri kwa, ma afọ agaghi-eju unu.


Asi na osisi fig adighi-ama ifuru, Na ọ dighi ihe-ọmume di n'osisi vine; Na ihe aluputara n'osisi olive ebilatawo, Na ubi nile emeghi ihe-oriri; Na ebipuwo ìgwè ewu na aturu n'ogige ewu na aturu, Na ọ dighi ìgwè ehi di n'ulo ehi:


Le, M'gaje ibasiri nkpuru-ọghigha nba ike n'ihi unu, fesa unu ǹsí-anu n'iru, bú ǹsí-anu nke anu ememe nile unu; agēbupu unu je n'ebe ọ di.


Onye anābu ọnu ka i gābu n'obodo, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n'ọhia.


Onye anābu ọnu ka i gābu na nbata-gi, onye anābu ọnu ka i gābu kwa n'ọpupu-gi.


Ihe agọziri agọzi ka ọ gābu, bú nkpuru nke afọ-gi, na nkpuru nke ala-ubi-gi, na nkpuru nke anu-ulo-gi, bú umu ehi-gi muru, na umu ìgwè ewu na aturu gi.


gi akpọla isi ala nye ha, efè-kwa-la ha òfùfè: n'ihi na Mu onwem, bú Jehova Chineke-gi, bu Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bu nna leta umu-ha, leta kwa umu-umu nke-atọ, leta kwa nke-anọ, nke ndi nākpọm asì;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan