Unu aghawo ọtutu nkpuru, ma nke-ntà ka unu webatara; unu nēri ihe, ma ọ dighi afọ juworo unu; unu nāṅu ihe-ọṅuṅu, ma ọ dighi nṅuju-afọ unu ṅujuworo; unu yiri uwe, ma ọ dighi okpom-ọku nēkpo madu; ọzọ, onye nāluta ugwọ-ọlu nāluta ugwọ-ọlu itiye n'akpa puru epu.
Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.
Ma Abraham síri, Nwam, cheta na i nara ezi ihe-gi na ndu-gi, otù ahu Lazarọs narakwara ajọ ihe-ya: ma ub͕u a anākasi ya obi n'ebe a, ma gi onwe-gi nọ n'aru-ufu.