Elaija, bu onye Tisbe, onye sitere na ndi-nnọdu nke Gilead, we si Ehab, Jehova, bú Chineke nke Israel, nādi ndu, Onye m'guzoworo n'iru Ya, igirigi ma-ọbu miri-ozuzo agaghi-adi ma-ọli n'arọ ndia, ma ọ bu nání dika okwum si di.
Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua.
Ọ buru na apuam je n'ọhia, le, ndi ejiworo mma-agha b͕u! ma ọ buru na abàm n'obodo a, le, ndi nāria ọria site n'oké unwu! n'ihi na ma onye-amuma ma onye-nchu-àjà, ha akpaghariwo n'ala, ma ha amaghi ihe.
Jehova apughi kwa inagide kwa ọzọ, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu, n'ihi ihe-árú nile nke unu meworo; ala-unu we ghọ nkpọnkpọ ebe, na ihe-iju-anya, na ihe-nkọcha, ghara inwe onye-obibi, dika o si di ta.
M'gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, onye-obibi we ghara idi.
Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.
N'iru ha ka ọku nēripia ihe; ọ bu kwa n'azu ha ka ire-ọku nēsuye ọku esuye: dika ubi ahu ab͕ara ogige, bú Iden, ka ala di n'iru ha, n'azu ha ọ bu ọzara tọb͕ọrọ n'efu; e, ọ dighi kwa ihe ọ bula b͕apuworo n'aka-ha.
Emewom ka ọ puta, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), ọ gābà kwa n'ulo onye-ori na n'ulo onye ji aham aṅu iyi ugha: ọ gānọ kwa ọnọdu-abali n'etiti ulo-ya, me ka ọ gwusia, ya na osisi-ya na nkume-ya nile.
Ọ buru na unu agaghi-anu, ọ buru kwa na unu agaghi-etiye ya n'obi-unu, inye aham nsọpuru, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, M'gēzite kwa ọbubu-ọnu ahu n'aru unu, bua ngọzi nile unu ọnu: e, abuwokwam ha ọnu, n'ihi na unu adighi-etiye ya n'obi.
ọ we ghara inye onye ọ bula nime ha ufọdu nime anu-aru umu-ya nri ọ ga-eri, n'ihi na ọ dighi ihe ọ bula fọduru ya; nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke onye-iro-gi nākpab͕u gi n'ọnu-uzọ-ama-gi nile.