Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 28:12 - Bible Nso

12 Jehova gēmeghere gi ezi ulo-àkù-Ya, bú elu-igwe, inye miri-ozuzo nke ala-gi na mb͕e-ya, na igọzi omume nile nke aka-gi; i gēbinye kwa ọtutu mba ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebiri ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Onyenwe anyị ga-emeghepụ eluigwe ebe ụlọakụ ya dị, zidata mmiri nʼala gị nʼoge ya, ma gọzie akaọrụ gị niile. Ị ga-agbazinye ọtụtụ mba ihe, ma gị onwe gị agaghị esite nʼaka onye ọbụla gbaziri ihe ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 28:12
15 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri, na okwu Jehova ruru Elaija nti, n'arọ nke-atọ, si, Je, me ka Ehab hu gi anya; M'gēnye kwa miri-ozuzo n'elu uwa.


Ì bàwo n'ulo-nkwakọba nile nke snow, Ma-ọbu ì nāhu ulo-nkwakọba nile nke ákú-miri-igwe,


Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.


Ọgaranya nāchi ndi-ob͕eye, Ọzọ, orù ka onye nēbiri ego buru onye-nbinye.


M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.


M'gēnye kwa miri-ozuzo-unu na mb͕e-ha, ala gāmi kwa ihe-ọmume-ya, osisi nke ọhia gāmi kwa nkpuru-ha.


na m'gēnye miri-ozuzo ala-unu na mb͕e-ya, miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu, ka i we chikọta ọka-gi, na manya-vine ọhu gi, na manu-gi.


onye Livai gābia kwa, (n'ihi na ọ dighi òkè ma-ọbu ihe-nketa o soro gi nwe), ya na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, ha gēri kwa ihe, afọ gēju kwa ha; ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi n'omume nile nke aka-gi nke i nēme.


I ghaghi inye ya, ọ gaghi-ajọ-kwa-ra obi-gi njọ mb͕e i nēnye ya: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe a ka Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi n'omume-gi nile, na nime nseti aka-gi nile.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, gāgọzi gi, dika Ọ gwara gi okwu: i gānara kwa ọtutu mba ihe-ibe, ma gi onwe-gi agaghi-ab͕a ihe n'ibe; i gāchi kwa ọtutu mba, ma ha agaghi-achi gi.


onye ala ọzọ ka i gēbinye ihe n'uma; ma ebinyela nwa-nne-gi ihe n'uma: ka Jehova, bú Chineke-gi, we gọzie gi na nseti aka-gi nile, n'elu ala ahu ebe gi onwe-gi nābà inweta ya.


Jehova gēme ka miri-ozuzo nke ala-gi buru uzuzu na ájá: ọ gēsi n'elu-igwe dakwasi gi, rue mb͕e agēkpochapu gi.


Onye ahu gēbinye gi ihe, ma gi onwe-gi agaghi-ebinye ya: onye ahu gābu isi, ma gi onwe-gi gābu ọdùdù.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan