Diuteronomi 27:7 - Bible Nso7 i gāchu kwa àjà-udo, ri kwa ihe n'ebe ahu; i gāǹuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Chụọ aja udo nʼebe ahụ, rie ha, ma ṅụrịakwa ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị. Faic an caibideil |
Obi gātọm utọ nke-uku nime Jehova, nkpuru-obim gēteghari egwú ọṅù nime Chinekem; n'ihi na Ọ chiriwo uwe nzọputa yikwasim, O werewo uwe-nwuda ezi omume kpuchiem, dika onye nālu nwunye ọhu si ewere ihe ọma ike n'isi ke onwe-ya dika onye-nchu-àjà, na dika nwanyi anālu ọhu si ewere ihe-ejiji-ya nile chọ onwe-ya nma.
i gāṅuri kwa ọṅu n'iru Jehova, bú Chineke-gi, gi onwe-gi, na nwa-gi nwoke, na nwa-gi nwayi, na orù-gi nwoke, na orù-gi nwayi, na onye Livai nke nọ nime ọnu-uzọ-ama-gi nile, na ọbìa, na nwa-nb͕ei, na nwayi di-ya nwuru, ndi nọ n'etiti gi, n'ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.