Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 27:1 - Bible Nso

1 Moses na ndi-okenye Israel we nye ndi Israel iwu, si, Debe ihe nile enyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Mosis na ndị okenye Izrel nyere ndị Izrel iwu sị, “Debenụ iwu ndị a niile m na-enye unu taa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 27:1
13 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, n'anya Israel nile, bú nkpọkọta Jehova kpọkọtara, ma na nti Chineke-ayi, debenu, chọ kwa ihe nile Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu: ka unu we nweta ezi ala nka, me kwa ka umu-unu keta ya rue mb͕e ebighi-ebi, bú ndi gānọchi unu.


Ka ha we tukwasi obi-ha na Chineke, Ghara ichezọ omume nile nke Chineke, Ma debe ihe nile O nyere n'iwu:


Ma Ya onwe-ya siri, Nke bu ezi-okwu kari bu, ngọzi nādiri ndi nuru okwu Chineke, debe kwa ya.


Unu onwe-unu bu ndi-eyìm, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n'iwu.


Ndia bu okwu ahu nke Moses gwara Israel nile n'ofè Jọdan n'ọzara, n'Araba ahu na ncherita-iru Suf, n'etiti Peran, na Tofel, na Leban, na Hazerot, na Di-zahab.


Unu gēlezi kwa anya ime ukpuru nile na ikpé nile nke mu onwem nētiye n'iru unu ta.


Ubọchi ta ka Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi iwu ime ukpuru ndia na ikpé ndia: i gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, debe ha, me kwa ha.


na Ọ gēme kwa gi ka i kachasia mba nile O meworo elu, ibu otuto, ibu kwa aha, ibu kwa ihe mara nma; ka i we buru-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ndi nsọ, dika O kwuworo.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu mb͕e unu gāgabiga Jọdan rue ala ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi, na i gēguzoro onwe-gi nkume uku ọtọ, were ihe-ntechi techie ha:


Unu gējisi ike idebe ihe ahu nile nke Jehova, bú Chineke-unu, nyere n'iwu, unu gēdebe kwa ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke O nyeworo gi n'iwu.


N'ihi na onye ọ bula nke gēdebe iwu ahu dum, ma ọ su ngọngọ n'otù ihe, emewo ya ka ọ buru onye ikpé iwu ahu nile mara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan