Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 26:3 - Bible Nso

3 I gābiakute kwa onye-nchu-àjà nke gānọ na mb͕e ahu, si ya, Egosiwom Jehova, bú Chineke-gi, ta, na abatawom n'ala ahu nke Jehova ṅuru nna-ayi-hà iyi inye ayi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye Onyenwe anyị Chineke gị na abịala m nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 26:3
13 Iomraidhean Croise  

M'gēnye kwa gi, nye kwa nkpuru-gi gānọchi gi, ala ọnọdu-ọbìa-gi nile, bú ala Kenean nile, ka ọ buru ihe-onwunwe ebighi-ebi; M'gābu-kwa-ra ha Chineke.


nọ dika ọbìa n'ala nka, M'gānọye-kwa-ra gi, gọzie gi; n'ihi na gi na nkpuru-gi ka M'gēnye ala ndia nile, M'gēme kwa ka iyi ahu guzosie ike, bú nke M'ṅuru Abraham nna-gi;


Le, edowom ala ahu n'iru unu: banu, nweta ala ahu nke Jehova ṅuru nna-unu-hà iyi, bú Abraham na Aisak na Jekob, inye ha, inye kwa nkpuru-ha gānọchi ha.


ndikom abua ahu, ndi ise-okwu ahu diri, gēguzo n'iru Jehova, n'iru ndi-nchu-àjà na ndi-ikpé ndi gānọ na mb͕e ahu;


na i gēwere ufọdu nime nkpuru mbu nke nkpuru nile nke ala-ubi, nke i gēsi n'ala-gi nke Jehova, bú Chineke-gi, nēnye gi webata; i gētiye kwa ya n'abọ, jerue ebe ahu nke Jehova, bú Chineke-gi, gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu.


Onye-nchu-àjà gānara abọ ahu n'aka-gi, dọba ya n'iru ebe-ichu-àjà nke Jehova, bú Chineke-gi.


ebe ayi nwe-kwa-ra Onye-nchu-àjà uku edoro onye-isi èzí-na-ulo Chineke;


Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya.


N'ihi na onye-isi-nchu-àjà di otú a kwesiri ayi, Onye di ọcha n'obi, Onye nēnweghi obi ọjọ, Onye anēmerughi emeru, Onye ekewapuworo n'etiti ndi-nmehie, me kwa Ya ka Ọ di elu kari elu-igwe nile;


ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan