Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 26:19 - Bible Nso

19 na Ọ gēme kwa gi ka i kachasia mba nile O meworo elu, ibu otuto, ibu kwa aha, ibu kwa ihe mara nma; ka i we buru-kwa-ra Jehova, bú Chineke-gi, ndi nsọ, dika O kwuworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 O kwuru na ọ ga-emekwa ka i karịa mba niile o kere elu, nʼotuto, nʼaha, nsọpụrụ na ịja mma. Na unu ga-abụkwa mba dị nsọ nye Onyenwe anyị Chineke unu, dịka o kwere na nkwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 26:19
21 Iomraidhean Croise  

O we me ka mpi ndi-Ya nwere di elu, Iburu ndi-ebere-Ya nile otuto; Bú umu Israel, ndi di nso Ya. Tonu Ja.


Ma ub͕u a, ọ buru na unu ege nti n'olum n'ezie, ọ buru kwa na unu edebe ọb͕ub͕a-ndum, unu gābu-kwa-ram ihe nke akam kari ndi nile: n'ihi na ọ bu Mu nwe uwa nile:


unu onwe-unu gābu-kwa-ram ala-eze ndi-nchu-àjà, na mba di nsọ. Ndia bu okwu nke i gāgwa umu Israel.


Ha gākpọkwa ha Ndi nsọ ahu, Ndi Jehova b͕aputaworo: agākpọ kwa gi Obodo achọputara achọputa, Obodo anārapughi arapu.


N'ihi na dika ihe-ọkiké nārapara n'úkwù madu, otú a ka M'meworo ka ulo Israel nile na ulo Juda nile rapara n'arum, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); ka ha we ghọrọm otù ndi, na aha, na otuto, na ima-nma: ma ha anughi.


Israel bu ihe nsọ Jehova nwere, nkpuru mbu nke ihe-ọmume-Ya: ikpe gāma ndi nile nke nēripia ya; ihe ọjọ gābiakwasi ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Obodo a gāghọ-kwa-ram aha obi-utọ, na otuto, na ima-nma, diri mba nile nke uwa, ndi gānu ezi ihe ahu nile nke Mu onwem nēmere ha, ndi gātu kwa oké egwu ma jijiji n'ihi ezi ihe ahu nile na n'ihi udo ahu nile nke Mu onwem nēmere ya.


Le, M'ganēmeso ndi ahu nile, bú ndi nēweda gi n'ala, na mb͕e ahu: M'gāzọputa kwa nwanyi ahu nke nēje nsukwara-achi, ọ bu kwa nwanyi nke achupuru achupu ka M'gāchikọta; M'gēme kwa ka ha ghọ otuto, ghọ kwa aha, bú ndi ihere-ha di n'uwa nka nile.


Na mb͕e ahu ka M'gēme ka unu bata, ọ bu kwa na mb͕e ahu ka M'gāchikọta unu: n'ihi na M'gēme ka unu ghọ aha, ghọ kwa otuto n'etiti ndi nile di iche iche nke uwa, mb͕e M'gēme ka ndi-unu adọtara n'agha lata n'anya-unu, ka Jehova siri.


Ọ gēru kwa na, dika unu buri nkọcha n'etiti mba nile, unu ulo Juda na ulo Israel, otú a ka M'gāzọputa unu, unu aburu ngọzi: unu atula egwu, kama ka aka-unu di ike.


Moses na ndi-okenye Israel we nye ndi Israel iwu, si, Debe ihe nile enyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta.


Ọ gēru kwa, ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu nke Jehova, bú Chineke-gi, ilezi anya ime ihe nile O nyere n'iwu, bú nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, na Jehova, bú Chineke-gi, gēme gi ka i kachasia mba nile nke uwa elu:


Jehova gēme kwa gi isi, ọ bughi ọdudu; i gādi nání n'elu, i gaghi-adi kwa n'okpuru; mb͕e i gēge nti ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta, idebe na ime ha;


Jehova gēme ka i guzosiere Ya ike ibu ndi nsọ, dika Ọ ṅuru gi iyi; mb͕e i gēdebe ihe nile Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, mb͕e i gēje kwa ije n'uzọ-Ya nile.


N'ihi na ndi nsọ ka i buru Jehova, bú Chineke-gi: ọ bu gi ka Jehova, bú Chineke-gi, rọputaworo iburu Ya ihe nke aka Ya, kari ndi nile ndi nọ n'elu ala.


ewe were kwa unu onwe-unu, dika nkume di ndu, wu, ka unu buru ulo nke Mọ Nsọ, ka unu we buru òtù ndi-nchu-àjà di nsọ, ichu àjà nke di ka Mọ Nsọ si cho, nke di Chineke ezi nma site na Jisus Kraist.


Ma unu onwe-unu bu ọb͕ọ ndi arọputaworo, òtù ndi-nchu-àjà ndi bu kwa eze, mba di nsọ, ndi nke Chineke nwetara, ka unu we kwusa idi-nma nile nke Onye ahu Onye kpọputara unu n'ọchichiri ahu ba n'ìhè-Ya di ebube:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan