Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 24:5 - Bible Nso

5 Mb͕e nwoke gāluru nwunye ọhu, ọ gaghi-apu ba n'usu-ndi-agha, madu agaghi-agabiga rue ebe ọ nọ bayere ihe ọ bula: onye puru n'òfùfè-ala ka ọ gābu n'ulo-ya otù arọ, ọ gēme kwa ka nwunye-ya nke ọ luruworo ṅuria ọṅu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Nwoke ọbụla lụrụ nwunye ọhụrụ agaghị apụ soro ndị agha, maọbụ soro rụọ ọrụ ọzọ pụrụ iche, otu afọ ka ọ ga-enwere onwe ya ịnọ nʼụlọ ya, ya na nwunye ya, ime onwe ha obi ụtọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 24:5
12 Iomraidhean Croise  

N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru.


Ka isi-iyi-gi buru ihe agọziri agọzi; Ṅuri kwa ọṅu na nwunye i luru n'okorọbia.


Di ndu ọṅù, gi na nwunye nke i huru n'anya, ubọchi nile nke ndu ihe-efu-gi, nke O nyeworo gi n'okpuru anyanwu, ubọchi nile nke ihe-efu-gi: n'ihi na nke ahu bu òkè-gi na ndu, na nime ndọb͕u-gi nke gi onwe-gi nādọb͕u onwe-gi n'ọlu n'okpuru anyanwu.


Onye ọzọ sikwara, Alurum nwunye, n'ihi nka apughi m ibia.


Ma nka ka m'nēkwu, umu-nnam, emewo ka oge a di nkpunkpu, ka ndi nwere nwunye we di ka ha enweghi site n'ub͕u a;


Ònye bu kwa nwoke nke kwere ilu nwayi, ma o kēkubataghi ya? ya je laghachi n'ulo-ya, ka ọ ghara inwu n'agha, nwoke ọzọ ewe kubata ya.


Madu agaghi-ewere nkume-igwe-nri ma-ọbu aka-nkume n'ihe-ibe: n'ihi na ndu madu ka onye ahu nēwere n'ihe-ibe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan