12 Ma ọ buru na onye ewedara n'ala ka ọ bu, ewela ihe-ibe-ya dina ala:
12 Ọ bụrụ na ọ bụ onye ogbenye na-enweghị ihe, e jidela ihe ibe ya naba ụra abalị.
N'ihi na i narawo nwa-nne-gi ihe-ibe n'efu, Uwe nile nke ndi b͕a ọtọ ka i nēyipu kwa.
Ha we nējeghari b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, N'agu-ha ka ha nēbu kwa ùkwù-ọka;
Ha nākpupu inyinya-ibu nke umu-nb͕ei, Ha nānara kwa ehi nke nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe.
Ha nānọ ọnọdu-abali b͕ara ọtọ nēnweghi uwe, Ọ dighi kwa ihe-nb͕okwasi ha nwere n'oyi.
Ufọdu nānapu nwa-nb͕ei n'ara n'ike, Nara kwa onye ewedara n'ala ihe-ibe:
N'èzí ka i gēguzo, nwoke ahu onye gi onwe-gi nēbinye ihe gēweputa-kwa-ra gi ihe-ibe-ya n'èzí.
i ghaghi inyeghachi ya ihe-ibe ahu mb͕e anyanwu nāda, ka o we dina ala n'uwe-ya, we gọzie gi: o we buru gi ezi omume n'iru Jehova, bú Chineke-gi.
Ewezugala ikpé ọbìa, bú nwa-nb͕ei; ewere-kwa-la uwe nwayi di-ya nwuru n'ihe-ibe: