Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Diuteronomi 23:6 - Bible Nso

6 Achọla udo-ha na ọdi-nma-ha ubọchi-gi nile rue mb͕e ebighi-ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Achọla udo ndị Amọn na Moab, na ọdịmma ha ụbọchị ndụ gị niile ruo mgbe ebighị ebi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Diuteronomi 23:6
9 Iomraidhean Croise  

O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o tiye ha n'okpuru mma-nkwọ, na n'okpuru ígwè nēbì ihe, na n'okpuru anyu-ike ígwè, me kwa ka ha gabiga n'ihe eji akpu brick: otú a ka ọ nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.


Eleghi anya Jehova gēlekwasi nwedam anya, Jehova gēnyeghachikwam ezi ihe n'ọnọnọdu nkọcha-ya ta.


O tib͕u-kwa-ra Moab, were udọ̀-ọtùtù tùa ha, me ha ka ha dina ala; o we tùa udọ̀-ọtùtù abua ime ka ha nwua, na udọ̀ ọtùtù zuru ezu ime ka ha di ndu. Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma.


Ma ub͕u a unu enyela umu-ha ndikom umu-unu ndinyom, unu ekuru-kwa-la umu-ha ndinyom nye umu-unu ndikom, unu achọ-kwa-la udo-ha ma-ọbu ọdi-nma-ha rue mb͕e ebighi-ebi: ka unu we di ike, rie ezi ihe nke ala ahu, me kwa ka umu-unu nweta ya rue mb͕e ebighi-ebi.


N'ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n'anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n'ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi.


Ndim, biko, cheta ihe Belak, bú eze Moab, b͕ara n'ìzù, na ihe Belam nwa Beoa zara ya; cheta site na Shitim rue Gilgal, ka unu we mara ezi omume nile nke Jehova.


Iwe Belak we di ọku megide Belam, ọ kua aka-ya abua: Belak we si Belam, Ọ bu ikọcha ndi-irom ka m'kpọrọ gi, ma, le, i gọziwo ha nọ̄ ub͕ò atọ ndia.


kama ọ bu n'ihi na Jehova huru unu n'anya, na n'ihi na O debere iyi Ọ ṅuru nna-unu-hà, ka Jehova were aka di ike me ka unu puta, O we b͕aputa unu n'ulo ndi-orù, n'aka Fero, bú eze Ijipt.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan